‘Aga M Agba Ebe Ịchụàjà Gị Gburugburu, Jehova’
“AGA m akwọ ọbụ aka m abụọ n’emeghị ihe ọjọọ; wee gbaa ebe ịchụàjà Gị gburugburu otú a, Jehova.” (Abụ Ọma 26:6) Eze Devid nke oge ochie ji okwu ndị a kwupụta ofufe ọ na-enye Jehova. Otú ọ dị, n’ihi gịnị ka ọ ga-eji “gbaa ebe ịchụàjà [Jehova] gburugburu,” ọ bụkwa n’echiche dị aṅaa?
Nye Devid, ebe ofufe Jehova hiwere isi bụ n’ụlọikwuu ahụ na ebe ịchụàjà ya e ji ọla copper mee, bụ́ nke dị na Gibeọn, n’ebe ugwu Jerusalem, n’oge ọchịchị ya. (1 Ndị Eze 3:4) Nke ọ bụla n’ime akụkụ anọ nke ebe ịchụàjà ahụ dị nanị ihe dị ka mita 2.2, bụ́ nke dị nnọọ obere ma e were ya tụnyere ebe ịchụàjà ahụ buru ibu nke a ga-ewu n’ogige ụlọ nsọ Solomọn.a Ma, Devid nwere obi ụtọ dị ukwuu n’ebe ụlọikwuu ahụ na ebe ịchụàjà ya dị, bụ́ ebe ofufe dị ọcha hiwere isi n’Israel.—Abụ Ọma 26:8.
A chụrụ àjà nsure ọkụ, àjà udo, na àjà ikpe ọmụma n’ebe ịchụàjà ahụ, e nwekwara àjà ndị a chụrụ maka mba ahụ n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie a na-enwe kwa afọ. Ebe ịchụàjà ahụ na àjà ndị a chụrụ na ya nwere ihe ha pụtara nye ndị Kraịst taa. Pọl onyeozi kọwara na ebe ịchụàjà ahụ nọchiri anya uche Chineke, bụ́ nke ọ dabeere na ya nara àjà kwesịrị ekwesị maka mgbapụta nke ihe a kpọrọ mmadụ. Pọl kwuru, sị: “Ọ bụkwa n’ọchịchọ a ka e doworo anyị nsọ site n’iche ahụ Jisọs Kraịst n’ihu Chineke dị ka àjà nanị otu mgbe.”—Ndị Hibru 10:5-10.
Mgbe ha chọwara ịchụ àjà n’ebe ịchụàjà, ndị nchụàjà na-akwọkarị aka ha na mmiri iji sachaa onwe ha. Mgbe ahụ, n’ụzọ kwesịrị ekwesị, Eze Devid kwọrọ aka ya “n’emeghị ihe ọjọọ” tupu ọ ‘gagharịa ebe ịchụàjà gburugburu.’ O mere omume “n’izu okè nke obi, na n’izi ezi.” (1 Ndị Eze 9:4) A sị na ọ kwọghị aka ya n’ụzọ dị otú a, a garaghị anara ofufe ya—‘ngagharị ọ na-agagharị ebe ịchụàjà gburugburu.’ N’ezie, Devid abụghị onye Livaị, o nweghịkwa ihe ùgwù nke ije ozi dị ka onye nchụàjà n’ebe ịchụàjà ahụ. N’agbanyeghị na ọ bụ eze, e kweghịdị ya ka ọ bata n’ogige ụlọikwuu ahụ. Ma, dị ka onye Israel kwesịrị ntụkwasị obi, o rubeere Iwu Mosis isi ma na-eweta ihe ịchụàjà ya mgbe mgbe maka ịchụ àjà n’ebe ịchụàjà ahụ. Ọ gagharịrị ebe ịchụàjà gburugburu n’echiche bụ́ na o mere ka ndụ ya dabere n’ofufe dị ọcha.
Ànyị pụrụ ịgbaso ihe nlereanya Devid taa? Ee. Anyị onwe anyị kwa pụrụ ịkwọ aka anyị n’emeghị ihe ọjọọ, na-agbakwa ebe ịchụàjà Chineke gburugburu ma ọ bụrụ na anyị egosipụta okwukwe n’àjà Jisọs ma jiri ‘ọbụ aka abụọ n’emeghị ihe ọjọọ, na obi dị ọcha,’ na-ejere Jehova ozi sitere n’obi dum.—Abụ Ọma 24:4.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Nke ọ bụla n’ime akụkụ anọ nke ebe ịchụàjà ahụ dị ihe dị ka mita itoolu.
[Foto dị na peeji nke 23]
Ebe ịchụàjà ahụ sere onyinyo uche Jehova, bụ́ nke ọ dabeere na ya nara àjà kwesịrị ekwesị maka mgbapụta nke ihe a kpọrọ mmadụ