Ịnọgide Na-eguzosi Ike N’ihe nye Jehova
IGUZOSI ike n’ihe, ọ bụ ezie na ọ bụ ihe bara uru nke dị ụkọ taa, bụ àgwà e ji mara ndị na-ejere ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova, ozi. Onye na-eguzosi ike n’ihe na-akwụsi ike n’oge ule dị iche iche, ọ dịghịkwa ada ada n’agbanyeghị oge gafeworonụ. Tụlee ihe banyere ezi Eze Hezekaịa. “Mgbe ọ nwụsịrị ọ dịghịkwa onye ọzọ dị ka ya n’etiti eze nile nke Juda, ma ọ bụ n’etiti ndị buru ya ụzọ,” ka Bible na-ekwu. Gịnị mere Hezekaịa ji pụọ iche? Ọ “[rapaara] Jehova n’ahụ,” n’agbanyeghị na ndị na-efe chi ụgha bụ́ Mọlek gbara ya gburugburu. Ee, Hezekaịa “[esighị n’iso Jehova] wezụga onwe ya, o wee debe ihe nile O nyere n’iwu.”—2 Ndị Eze 18:1-6.
Pọl onyeozi bụ onye ọzọ nọgidere na-eguzosi ike n’ihe nye Jehova. Ihe ndekọ nke ozi ya dị ka ọ dị n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst na-agba akaebe doro anya nye nnọgide Pọl nọgidere na-eji mkpụrụ obi ya dum ejere Chineke ozi. Ná ngwụsị nke ndụ ya n’elu ala, Pọl kwuru banyere onwe ya, sị: “Agbasịwo m mgba ọma ahụ, agbasịwo m ọsọ ahụ, edebesịwo m okwukwe ahụ.”—2 Timoti 4:7.
Lee ihe nlereanya ọma nke iguzosi ike n’ihe ndị Hezekaịa na Pọl setịpụụrụ anyị! Ka anyị ṅomie okwukwe ha site n’ịnọgide na-eguzosi ike n’ihe nye Chineke Ukwu anyị, bụ́ Jehova.—Ndị Hibru 13:7.