N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Na-agbaghara?
“NDỊ ọkà mmụta sayensị ebidola nchọpụta nke maliteworo igosi na mgbaghara pụrụ ime ka e nwekwuo ezi ahụ ike nke mmetụta uche—na, ikekwe nnọọ, nke anụ ahụ,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Toronto Star nke Canada na-akọ. Ma, Prọfesọ Carl Thoresen nke Mahadum Stanford, U.S.A., bụ́ onye nchọpụta na-edu Nchọpụta nke Stanford Banyere Mgbaghara, na-ekwu na e nwere “nanị mmadụ ole na ole ghọtara ihe mgbaghara bụ na otú o si arụ ọrụ.”
A na-ewere ezi mgbaghara dị ka akụkụ dị mkpa nke Iso Ụzọ Kraịst. Akụkọ dị na The Toronto Star na-akọwa ya dị ka “ịghọta na e mejọwo gị, ịkwụsị iwe nile na-ewe gị n’ihi ya, na imesị jiri ọmịiko na ọbụna ịhụnanya meghachi omume n’ebe onye ahụ mejọrọ gị nọ.” A ghaghị ime ka ọdịiche dị n’etiti ya na ịnabata, ịgọpụrụ, ichezọ, ma ọ bụ ịgọnahụ mmejọ pụta ìhè; ọ pụtaghịkwa itinyeghachi onwe gị n’ọnọdụ na-eweta nkọcha. Akụkọ ahụ na-ekwu na isi ihe na-eduga n’ezi mgbaghara bụ “ịkwụsị iwe iwe na inwe mmetụta ndị na-ezighị ezi.”
Ndị nchọpụta na-ekwu na ọ dị mkpa ka e mekwuo nnyocha banyere uru mgbaghara bara n’ụzọ anụ ahụ. Otú ọ dị, ha na-akọ banyere uru ndị ọ bara n’ụzọ akparamàgwà, nke gụnyere “enwechaghị nchekasị, nchegbu na ịda mbà n’obi.”
E kwupụtara ezigbo ihe mere a ga-eji na-agbaghara ná Ndị Efesọs 4:32, nke na-asị: “Nwerịtanụ obiọma n’ahụ ibe unu, nweenụ obi ọmịiko, werekwanụ amara gbaghara onwe unu, dị ka Chineke werekwaara amara gbaghara unu n’ime Kraịst.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) A bịa ná mgbaghara, dị ka ọ dị n’ihe ndị ọzọ, a na-agba anyị ume ịbụ ndị na-eṅomi Chineke.—Ndị Efesọs 5:1.
Ịjụ ịgbaghara ndị ọzọ mgbe e nwere ihe ndabere maka ime ebere pụrụ imetụta mmekọrịta anyị na Chineke n’ụzọ dị njọ. Jehova na-atụ anyị anya n’aka ịgbaghara ibe anyị. Ọ bụ mgbe ahụ ka anyị pụrụ ikpe ekpere ka ọ gbaghara anyị.—Matiu 6:14; Mak 11:25; 1 Jọn 4:11.