Ịdị N’otu Okpukpe Ọ̀ Dị Nso?
“Anyị na-ahụ ụbọchị dị ịrịba ama n’akụkọ ihe mere eme nke chọọchị anyị dị iche iche,” ka Christian Krause, bụ́ onyeisi oche nke Njikọ Òtù Lutheran n’Ụwa Nile kwuru. N’otu aka ahụ, Popu John Paul nke Abụọ kwuru banyere “oge dị ịrịba ama n’okporo ụzọ ahụ tara akpụ nke na-eduga ná nguzobeghachi nke ịdị n’otu zuru ezu n’etiti ndị Kraịst.”
Ihe kpalitere nkwupụta ndị a e ji ịnụ ọkụ n’obi mee bụ mbịanye aka a bịanyere n’otu Nkwekọrịta Ndị Isi e mere n’October 31, 1999, n’Augsburg, Germany, na-emesikwu Nkwupụta E Jikọrọ Aka Mee n’Ozizi nke Izi Ezi, ike. A họtara oge na ebe a ga-eme ihe omume ahụ nke ọma. E kwuru na n’October 31, 1517, Martin Luther ji ntú kụgide ihe odide 95 ya n’ibo nke nnukwu ụlọ chọọchị ahụ dị na Wittenberg, si otú ahụ mee ka Mgbanwe nke Ndị Protestant malite. N’ezie, ọ bụ n’Augsburg ka ndị òtù Luther wepụtara na 1530 nkwenkwe ha bụ́ isi, bụ́ Nkwupụta Nkwenkwe nke Augsburg, nke Chọọchị Katọlik jụrụ, bụ́ nke dugara n’esemokwu na-ekweghị ndozi n’etiti Okpukpe Protestant na Okpukpe Katọlik.
Nkwupụta E Jikọrọ Aka Mee ọ̀ ga-abụ nzọụkwụ dị mkpa n’imeri nkewa nke chọọchị ahụ, dị ka a na-azọrọ? Ọ bụghị ndị òtù ha nile nwere nchekwube. Ihe karịrị ndị ọkà mmụta okpukpe Protestant 250 bịanyere aka n’akwụkwọ mkpesa na-emegide ya, na-adọ aka ná ntị na Chọọchị Katọlik ga-eweghara ha. Ahụ gbakasịkwara ndị Protestant mgbe Chọọchị Katọlik kwupụtara na a ga-enwe oge onyinye maka mgbaghara mmehie pụrụ iche maka afọ 2000, bụ́ kpọmkwem ihe omume kpalitere esemokwu ahụ afọ 500 gara aga. Ebe ọ bụkwanụ na Nkwupụta Nkwenkwe nke Augsburg ahụ na mgbagha nke ndị Katọlik bụ́ nke Kansụl nke Trent mere ka dịcha ya, ịdị n’otu abụtụghị ihe e ji n’aka.
Nkewa na esemokwu ahụ dị na Krisendọm karịrị nnọọ ihe ịbịanye aka ná nkwupụta ọ bụla a gbakọrọ aka mee pụrụ idozi. Ọzọkwa, ịdị n’otu n’okwukwe na-adabere na nkwenkwe ndị dabesiri ike n’Okwu Chineke, bụ́ Bible. (Ndị Efesọs 4:3-6) Kama inweta ya site ná nkwekọrịta, a na-enweta ezi ịdị n’otu site n’ịmụ na ime ihe Chineke na-achọ n’aka anyị. “Ndị nile dị iche iche na-ejegharị, onye ọ bụla n’aha nke chi ya,” ka onye amụma kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Maịka kwuru, “anyị onwe anyị ga na-ejegharịkwa n’aha Jehova, bụ́ Chineke anyị, ruo mgbe nile ebighị ebi.”—Maịka 4:5.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 32]
© Ralph Orlowski/REUTERS/Archive Photos