Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w01 2/1 p. 8
  • Latvia Emeghachi Omume n’Ozi Ọma Ahụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Latvia Emeghachi Omume n’Ozi Ọma Ahụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • O Meghị Agadi Gabiga Ókè Ijere Jehova Ozi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Otu Onye Nkụzi Agbanwee Echiche Ya
    Teta!—2009
  • A Naghị Etofe Ife Chineke Etofe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Mee Baptizim n’Egbughị Oge
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
w01 2/1 p. 8

Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ

Latvia Emeghachi Omume n’Ozi Ọma Ahụ

BIBLE na-egosi n’ụzọ doro anya na ọ bụ uche Chineke ka “a zọpụta mmadụ nile, ka ha bịaruokwa mmazu nke eziokwu.” (1 Timoti 2:4) Ndị a napụworo ohere nke ịnụ ozi ọma ahụ ruo ọtụtụ afọ na-anụ ya ugbu a! Na Latvia, dị ka ọ dị n’akụkụ ụwa ndị ọzọ, ndị mmadụ nọ n’afọ ndụ nile nakwa ndị nwere ụdị nzụlite dị iche iche na-emeghachi omume n’ozi ahụ, dị ka ahụmahụ ndị na-esonụ na-egosi.

• Na Rēzekne, bụ́ obodo dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Latvia, otu nne na nwa ya nwanyị nọ n’afọ iri na ụma jụrụ otu nwanyị n’okporo ámá maka nduzi. Ka o nyesịrị ha nduzi ahụ, nwanyị ahụ, bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova, kpọrọ ha òkù ịbịa nzukọ Ndịàmà.

Ebe ọ bụ na nwanyị ahụ na nwa ya nwanyị bụ ndị nwere mmasị n’okpukpe, ha kpebiri ịga nzukọ ahụ. N’ụzọ, ha kwekọrịtara na ọ bụrụ na ha achọpụta ihe ọ bụla na-ekwesịghị ekwesị n’ebe ahụ, ha ga-ala ozugbo. Otú ọ dị, nzukọ ahụ tọrọ ụtọ nke ukwuu nke na echiche ịla abatatụghịdị n’uche ha. Ha nakweere ọmụmụ Bible ma malite ịbịachị nzukọ anya. N’ime ọnwa atọ nanị, ha kwupụtara ọchịchọ ha isonye n’ọrụ nkwusa ma na-atụ anya ịbụ ndị a ga-eme baptism.

• N’otu obodo ukwu dị n’ebe ọdịda anyanwụ Latvia, otu Onyeàmà zutere Anna dị afọ 85, bụ́ onye gosiri ezi mmasị ma nakwere ọmụmụ Bible. Nwa ya nwanyị na ndị òtù ezinụlọ ya ndị ọzọ megidesiri ya ike. Ma Anna ekweghị ka nke ahụ ma ọ bụ ịka nká na ahụ esighị ike ya gbochie ya ịga n’ihu n’ọmụmụ Bible ya.

Otu ụbọchị, Anna gwara nwa ya nwanyị na ya gaje ime baptism. “Ọ bụrụ na i mee baptism, m ga-akpọga gị n’ebe a na-elekọta ndị agadi,” ka nwa nwanyị Anna kwuru. Otú ọ dị, iyi egwu a egbochighị Anna. N’ihi ọnọdụ ahụ ike ya, e mere ya baptism n’ebe obibi ya.

Olee otú nwa nwanyị Anna si meghachi omume na nke a? Ọ gbanwere obi ya ma siere nne ya nri pụrụ iche mgbe o mesịrị baptism. Mgbe ahụ, ọ jụrụ nne ya, sị: “Olee mmetụta ị na-enwe ugbu a e mere gị baptism?” Gịnị bụ nzaghachi Anna? “Dị ka nwa a mụrụ ọhụrụ!”

• Na December 1998, Ndịàmà abụọ zutere otu onye agha laworo ezumike nká n’ebe bụbu Soviet Union. Ebe ọ bụ na o kweere n’Onye Okike, ọ nakweere ọmụmụ Bible, nwunye ya sonyekwara n’ikpeazụ. Ha nwere ọganihu ngwa ngwa, n’oge na-adịghịkwa anya ha ghọrọ ndị nkwusa a na-emebeghị baptism. Ka ọ na-erule oge okpomọkụ ọzọ, e mere onye a bụbu onye agha baptism. Oké ịhụnanya di na nwunye a nwere maka ihe ime mmụọ abụrụwo ihe agbamume nye ndị nile nọ n’ọgbakọ. Tụkwasị na nke a, ha tinyere onwe ha n’ọrụ n’ịrụgharị otu ebe obibi dị n’ógbè ahụ ịghọ Ụlọ Nzukọ Alaeze mara mma.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya