Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w02 4/1 p. 32
  • A Dịghị Etofe Ịmụta Ihe Etofe

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • A Dịghị Etofe Ịmụta Ihe Etofe
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
w02 4/1 p. 32

A Dịghị Etofe Ịmụta Ihe Etofe

AMỤRỤ Kseniya na 1897. Ọ mụrụ ụmụ nwanyị atọ, otu nwoke, nwee ụmụ ụmụ 15, na ụmụ ụmụ ụmụ 25. Ná ndụ ya nile, o mere ihe ndị mụrụ ya kụziiri ya ime. Ọ bụ ezie na o si Abkhaz Republic nke agha tisasịworo, bụ́ nke dị n’agbata Oké Osimiri Ojii na Caucasus, gbaga Moscow dị ka onye gbara ọsọ ndụ, ndụ ya, karịsịa ihe ọ kpọrọ okpukpe o ketara eketa, juru ya nnọọ afọ.

Na 1993, nwa Kseniya bụ́ Meri ghọrọ otu n’ime Ndịàmà Jehova. Meri malitere ịgwa Kseniya banyere Jehova Chineke na Bible, ma ọ chọghị ige ntị. Kseniya nọgidere na-agwa nwa ya nwanyị, sị, “Etofeela m ịmụta ihe ọhụrụ.”

N’agbanyeghị nke ahụ, nwa ya nwanyị bụ́ Meri; nwunye nwa nwa ya, bụ́ Londa; na ụmụ ụmụ ụmụ ya bụ́ Nana na Zaza, bụ́ ndị ghọcharala Ndịàmà Jehova, nọgidere na-agwa ya banyere Bible. Otu uhuruchi na 1999, ha gụọrọ Kseniya otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ nke metụrụ ya n’obi. Ihe e dere na ya bụ okwu na-akpali akpali Jizọs gwara ndịozi ahụ kwesịrị ntụkwasị obi mgbe ọ na-eguzobe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị. (Luk 22:19, 20) N’uhuruchi ahụ, bụ́ mgbe Kseniya dị afọ 102, o kpebiri ịmụ Bible.

“Mgbe m bisịrị ndụ ruo afọ 102,” ka Kseniya na-ekwu, “emesịrị m ghọta nzube nke ndụ. Ana m aghọta ugbu a na ọ dịghị ihe dị mma karịa ijere Chineke anyị dị ebube ma na-ahụ n’anya, bụ́ Jehova, ozi. Aka m gbasiri ike, ahụ́ dịkwa m. Apụrụ m ịgụ ihe n’ejighị ugegbe anya, apụkwara m iso ezinụlọ m na-akpakọ nke ọma.”

Na November 5, 2000, e mere Kseniya baptizim. Ọ na-ekwu, sị: “Ugbu a, enyefewo m Jehova ndụ m iji ịhụnanya na-ejere ya ozi. Ana m enyefe magazin na traktị dị iche iche ka m na-anọdụ ala n’ebe bọs na-akwụsị na nso ebe obibi m. Ndị ikwu m na-abịakarị eleta m, ana m ejikwa obi ụtọ eso ha na-ekerịta eziokwu banyere Jehova.”

Kseniya na-atụ anya ụbọchị ‘anụ ahụ́ ya ga-adị ọhụrụ karịa nke nwata, o wee laghachiruo ụbọchị agbọghọbịa ya.’ (Job 33:25) Ọ bụrụ na onye dịruworo ndụ 100 afọ echeghị na ya etofeela ịmụta ihe bụ́ nzube nke ndụ site na Bible, gịnị banyere gị?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya