Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w02 6/1 p. 30
  • Tetragrammaton nke Dị na Septuagint

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Tetragrammaton nke Dị na Septuagint
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
w02 6/1 p. 30

Tetragrammaton nke Dị na Septuagint

E JI Tetragrammaton, ya bụ, mkpụrụ okwu Hibru anọ bụ́ יהוה (YHWH), egosipụta aha Chineke, bụ́ Jehova. Ọ dịwo anya e kweere na Tetragrammaton ahụ apụtaghị na Septuagint. Ya mere, a rụrụ ụka na ọ ga-abụ na ndị dere Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst ejighị aha Chineke mee ihe n’ihe odide ha mgbe ha na-ehota ihe site n’Akwụkwọ Nsọ Hibru.

Ọtụtụ nchọpụta ndị e mere na narị afọ gara aga ma ọ bụ karịa kpughere na n’ezie, aha Chineke pụtara na Septuagint. Otu akwụkwọ na-asị: “Ọchịchọ a chọrọ ichebe aha nsọ nke Chineke n’ụzọ ziri nnọọ ezi siri nnọọ ike nke na ndị Juu bi na Gris, mgbe ha na-asụgharị Bible Hibru gaa na Grik, denyere mkpụrụ okwu Tetragrammaton ahụ kpọmkwem n’etiti ihe odide Grik.”

Ibe papaịrọs nke e gosiri n’aka ekpe bụ nanị otu n’ime ọtụtụ n’ime ha bụ́ ndị dịgideworo ruo ugbu a. N’ịbụ nke a chọtara n’Oxyrhynchus, Ijipt, ma nye nọmba bụ́ 3522, ibe papaịrọs a dịwara laa azụ na narị afọ mbụ O.A.a Ọ dị sentimita 10.5 n’ogologo na sentimita 7 n’obosara ma buru akụkụ ihe odide nke sitere na Job 42:11, 12. E ji mkpụrụ okwu Hibru mbụ dee Tetragrammaton ahụ, bụ́ nke a kara ihe gburugburu ya na foto ahụ.b

Ya mere, aha Chineke ọ̀ pụtara ná ndepụta ndị mbụ nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst? Ọkà mmụta bụ́ George Howard na-ekwu, sị: “Ebe ọ bụ na a ka na-ede Tetragram ahụ na Bible Grik [Septuagint] bụ́ nke ihe mejupụtara ya bụ Akwụkwọ Nsọ nke chọọchị mbụ ji mee ihe, ọ bụ ihe ezi uche dị na ya ikwere na ndị dere A[gba] Ọ[hụrụ], n’ihota ihe site n’Akwụkwọ Nsọ, chekwara Tetragram ahụ n’ihe odide nke Bible.” O yiri ka n’oge na-adịghị anya nke a gasịrị, ndị na-edepụtaghachi ihe hà ji ihe nnọchianya ndị dị ka Kyʹri·os (Onyenwe Anyị) and The·osʹ (Chineke) dochie aha Chineke.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Iji nwetakwuo ihe ọmụma banyere papaịrọs ahụ a chọtara n’Oxyrhynchus, lee Ụlọ Nche nke February 15, 1992, peeji nke 26-28.

b Iji nwetakwuo ihe atụ ndị ọzọ na-egosi na aha nsọ ahụ dị ná nsụgharị dị iche iche nke Grik oge ochie, lee New World Translation of the Holy Scriptures−With References, ihe odide ntụkwasị nke 1C.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 30]

Site n’aka Egypt Exploration Society

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya