Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w02 10/15 p. 32
  • “Mara Ihe n’Ikpeazụ Gị”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Mara Ihe n’Ikpeazụ Gị”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
w02 10/15 p. 32

“Mara Ihe n’Ikpeazụ Gị”

“Ihe ka ọtụtụ n’ihe a kpọrọ mmadụ na-ebi ndụ n’afọ ndị mbụ ha n’ụzọ na-eme ka ihe siere ha ike n’afọ ndị ikpeazụ ha.” Ihe a ka Jean de La Bruyère, bụ́ onye France na-ede edemede na narị afọ nke 17 kwuru. N’ezie, onye na-eto eto nke na-enwekarị obi abụọ pụrụ ịnọ n’amaghị mkpebi nke ọ ga-eme, bụrụ onye na-adịghị enwe afọ ojuju ma na-akwa ụta. N’aka nke ọzọ, onye ntorobịa dị isi ike pụrụ isi ọnwụ ịnọgide n’ụzọ amamihe na-adịghị na ya, na-eme ka ọ ghara inwe ọṅụ n’ikpeazụ nke ndụ ya. Nke ọ bụla ọ sọrọ ya bụrụ, emeghị ihe ziri ezi ma ọ bụ ime mpụ pụrụ ịkpata oké nhụsianya.

Olee otú a pụrụ isi zere ihe ndabara dị otú ahụ? Ka ọ na-adọ aka ná ntị megide inwe obi abụọ ndị ntorobịa, Okwu Chineke na-adụ ndị na-eto eto ọdụ, sị: “Chetakwa Onye keworo gị n’ụbọchị nile ị dị n’okorobịa, mgbe ụbọchị ihe ọjọọ aka-abịaghị, na mgbe afọ aka-abịarughị nso, mgbe ị ga-asị, Ha atọghị m ụtọ.” (Eklisiastis 12:1) Ọ bụrụ na ị bụ onye ntorobịa, were nzọụkwụ dị mma iji mụta banyere “Onye keworo gị” n’oge ị ka na-eto eto.

Oleezi otú Bible si enyere ndị na-eto eto aka izere omume nzuzu nke ndị ntorobịa? Ọ na-asị: “Nụrụ ndụmọdụ, narakwa ịdọ aka ná ntị, ka i wee mara ihe n’ikpeazụ gị.” (Ilu 19:20) Bible na-egosikwa n’ụzọ doro anya na ịjụ amamihe Chineke n’oge ntorobịa, ma ọ bụ n’oge ọ bụla ọzọ, n’ihi ejighị ihe kpọrọ ihe ma ọ bụ nnupụisi, na-akpata ihe ndị dị mwute. (Ilu 13:18) N’aka nke ọzọ, ịṅa ntị ná nduzi Chineke na-eme ka e nwee “ụbọchị ndụ nke dị ogologo, na ọtụtụ afọ nke ndụ, na udo,” ndụ na-eju afọ ma nwee nzube.—Ilu 3:2.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya