Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w02 11/1 p. 32
  • Ọ Dị Anyị Nile Mkpa Ka A Na-aja Anyị Mma

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọ Dị Anyị Nile Mkpa Ka A Na-aja Anyị Mma
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
w02 11/1 p. 32

Ọ Dị Anyị Nile Mkpa Ka A Na-aja Anyị Mma

NWA agbọghọ nta ahụ mere nke ọma taa. Ọ bụ ezie na ọ dị mkpa ka a gbazie ya n’oge ndị ọzọ, ọ kpara nnọọ àgwà dị mma taa. Otú ọ dị, n’abalị ahụ, ka nwa agbọghọ nta ahụ dinasịrị ala n’àkwà ndina, mama ya nụrụ ka ọ na-ebe ákwá. Mgbe a jụrụ ya ihe na-ewe ya iwe, o ji olu ákwá kwuo, sị: “Ọ̀ bụ na emeghị m nke ọma taa?”

Ajụjụ ahụ mara mama ya ka mma. Ọ nọwo na-adị ngwa mgbe nile ịgbazi nwa ya nwanyị. Ma ugbu a, n’agbanyeghị na ọ chọpụtara otú obere nwa ya nwanyị si gbalịsie ike ịkpa ezi àgwà, ọ gwaghị ya ọbụna otu okwu ịja mma.

Ọ bụghị nanị ụmụ agbọghọ nta chọrọ ka a na-aja ha mma ma na-emesighachi ha obi ike. Anyị nile chọrọ ya—dị nnọọ ka anyị chọrọ ndụmọdụ na mgbazi.

Olee otú ọ na-adị anyị mgbe a jara anyị mma site n’obi? Ọ̀ bụ na ọ dịghị enye anyị obi ụtọ ma na-ewuli anyị elu? Eleghị anya anyị na-enwe mmetụta na ọ dị onye hụrụ ihe anyị mere, na ọ dị onye na-eche banyere anyị. Ọ na-emesi anyị obi ike na ihe anyị mere ruru mgbalị anyị tinyere maka ya, ọ na-akwalikwa anyị ịrụsi ọrụ ike mgbe ọzọ. Ọ bụghị ihe ijuanya na ịja mma sitere n’obi na-adọtakarị anyị n’ebe onye wepụtara oge ịgwa anyị okwu na-agba ume nọ.—Ilu 15:23.

Jizọs Kraịst ghọtara mkpa ọ dị ịja mma. N’ilu ya banyere talent, nna ukwu ahụ (nke Jizọs n’onwe ya sere onyinyo ya) jara nke ọ bụla n’ime ohu abụọ ahụ kwesịrị ntụkwasị obi mma n’ụzọ na-ekpo ọkụ, na-asị: “I mere nke ọma, ezi ohu na-ekwesị ntụkwasị obi!” Lee ka nke ahụ si bụrụ ihe na-enye obi ụtọ! Ọ bụ ezie na ha nwere nnọọ ikike dịrịtara iche, rụzuokwa ihe dịrịtara iche, a jara ha mma n’ụzọ ha nhata.—Matiu 25:19-23.

Ya mere, ka anyị cheta nne nwa agbọghọ nta ahụ. Ọ dịghị anyị mkpa ichere ruo mgbe ndị ọzọ bewere ákwá tupu anyị ajawa ha mma. Kama nke ahụ, anyị pụrụ ime ka ọ bụrụ omume anyị ịchọ ohere ndị anyị ga-eji na-aja ndị ọzọ mma. N’ezie, anyị nwere ezi ihe mere anyị ga-eji jiri ohere ọ bụla dapụtaranụ na-ekwu okwu ịja mma sitere n’obi.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya