Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w03 7/15 p. 32
  • Ngụgụ Obi Nye Ndị Na-arịọ Maka Enyemaka

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ngụgụ Obi Nye Ndị Na-arịọ Maka Enyemaka
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
w03 7/15 p. 32

Ngụgụ Obi Nye Ndị Na-arịọ Maka Enyemaka

BIBLE abụghị akwụkwọ na-ekwu otú e si agwọ ọrịa uche. Otú ọ dị, ọ na-agụgụ anyị ma na-enyere anyị aka iji ndụ kpọrọ ihe n’agbanyeghị nsogbu ndị anyị na-enwe. Akwụkwọ Nsọ kwuru eziokwu mgbe ọ sịrị: “Mmadụ nke nwanyị mụrụ, ụbọchị ndụ ya dị mkpụmkpụ, afọ ejuwokwa ya n’ahụhụ.” (Job 14:1) Ezughị okè anyị na-akpata ụfọdụ n’ime ọnwụnwa ndị anyị na-enweta. Ma ònye bụ isi sekpụ ntị na-akpata nhụjuanya nke ụmụ mmadụ?

Bible na-eme ka a mara onye ọ bụ dị ka ajọ mmụọ a na-akpọ Ekwensu na Setan. Ọ “na-eduhie ụwa dum mmadụ bi” ma na-akpata ọtụtụ n’ime nsogbu ihe a kpọrọ mmadụ na-enwe. Ma, Bible na-agwakwa anyị na oge na-agwụnahụ ya. (Mkpughe 12:9, 12) N’isi nso, Chineke ga-eme ihe iji kwụsị nsogbu nile Setan wetaara ndị bi n’ụwa. Dị ka Bible si kwuo, ụwa ọhụrụ ezi omume nke Chineke kwere ná nkwa ga-eme ka enweghị olileanya na obi nkoropụ kwụsị.—2 Pita 3:13.

Lee ihe nkasi obi ọ bụ ịmara na nhụjuanya nke mmadụ agaghị adịte aka! N’okpuru ịchịisi nke Alaeze eluigwe nke Chineke bụ́ nke dị n’aka Jizọs Kraịst, ikpe na-ezighị ezi na nhụjuanya ga-abịa ná njedebe. Akwụkwọ Nsọ na-ekwu banyere Eze Chineke họpụtara, sị: “Ọ ga-anapụta ogbenye mgbe ọ na-etiku ya; ọ ga-anapụtakwa onye e wedara n’ala mgbe ọ dịghị onye na-enyere ya aka. Ọ ga-emere onye na-enweghị ike na ogbenye ebere, ọ bụkwa mkpụrụ obi ndị ogbenye ka ọ ga-azọpụta. Ọ ga-esi n’aka nzọgbu na n’aka ime ihe ike gbapụta mkpụrụ obi ha; ọbara ha ga-adịkwa oké ọnụ ahịa n’anya ya.”—Abụ Ọma 72:12-14.

Oge a ga-emezu okwu amụma ndị a dị ezi nso. Anyị pụrụ ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa paradaịs n’okpuru ọnọdụ ndị magburu onwe ha. (Luk 23:43; Jọn 17:3) Ịmara banyere nkwa ndị a na-akasi obi bụ́ ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ na-eme ka ndị na-arịọ maka enyemaka nwee olileanya, ọ na-agụgụkwa ha.

[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji 32]

Nwatakịrị nwanyị dara mbà n’obi: Photo ILO/J. Maillard

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya