Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w03 9/1 p. 32
  • Ezi Enyemaka Maka Ndị Ogbenye

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ezi Enyemaka Maka Ndị Ogbenye
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
w03 9/1 p. 32

Ezi Enyemaka Maka Ndị Ogbenye

MGBE Jizọs Kraịst, bụ́ Ọkpara Chineke, nọ n’ụwa, o gosiri ezi mmasị n’inyere ndị ogbenye aka. Otu onye ji anya ya hụ ihe merenụ kwuru banyere ozi Jizọs, sị: “Ndị ìsì na-ahụ ụzọ ọzọ, ndị ngwụrọ na-ejegharịkwa, a na-eme ka ndị ekpenta dị ọcha, ndị ntị chiri na-anụkwa ihe, a na-akpọlitekwa ndị nwụrụ anwụ, a na-akpọsakwara ndị ogbenye ozi ọma.” (Matiu 11:5) Otú ọ dị, gịnị banyere ọtụtụ nde ndị ogbenye taa? È nwere ozi ọma ọ bụla dịnụ maka ha? Ee, e nwere ozi olileanya!

Ọ bụ ezie na ụwa n’ozuzu ya na-elegharakarị ndị ogbenye anya ma na-echezọ ha, Okwu Chineke, bụ́ Bible, na-ekwe nkwa, sị: “Ọ bụghị ruo mgbe ebighị ebi ka a ga-echezọ ogbenye, olileanya nke ndị dị umeala n’obi agaghị ala n’iyi ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 9:18) Okwu ndị a na-agụgụ obi ga-emezu mgbe Alaeze Chineke, bụ́ ọchịchị eluigwe dị adị, nọchiri anya ịchịisi ụmụ mmadụ. (Daniel 2:44) Dị ka Eze nke ọchịchị eluigwe ahụ, Jizọs “ga-emere onye na-enweghị ike na ogbenye ebere, ọ bụkwa mkpụrụ obi ndị ogbenye ka ọ ga-azọpụta. Ọ ga-esi n’aka nzọgbu na n’aka ime ihe ike gbapụta mkpụrụ obi ha; ọbara ha ga-adịkwa oké ọnụ ahịa n’anya ya.”—Abụ Ọma 72:13, 14.

Olee otú ọnọdụ obibi ndụ ga-adị mgbe Kraịst malitere ịchị ụwa? Ndị ga-adị ndụ mgbe Kraịst malitere ịchị ụwa ga-eri ihe aka ha rụtara. Bible na-ekwu na Maịka 4:3, 4, sị: “Ha ga-ebi, onye ọ bụla n’okpuru osisi vaịn ya na n’okpuru osisi fig ya; ọ dịghịkwa onye ga-eme ka ha maa jijiji: n’ihi na ọnụ nke Jehova nke usuu nile nke ndị agha ekwuwo okwu.” Ọbụna, Alaeze Chineke ga-agwọta nsogbu nke ọrịa na ọnwụ. (Aịsaịa 25:8) Lee ka ụwa ga-esi dị iche mgbe ahụ! Anyị pụrụ ikwere ná nkwa ndị a dị na Bible n’ihi na ha sitere n’aka Chineke n’onwe ya.

Tụkwasị n’inye ozi olileanya, Bible na-enyere anyị aka ịnagide ihe ịma aka ndị a na-enwe kwa ụbọchị, dị ka ụzọ isi merie enweghị ùgwù onwe onye, bụ́ nke ịda ogbenye pụrụ ịkpata. Onye Kraịst nọ ná mkpa maara site n’ọmụmụ Bible ya na ya dị oké ọnụ ahịa n’anya Chineke dị nnọọ ka Onye Kraịst bara ọgaranya dị. Akwụkwọ Bible bụ́ Job na-ekwu na Chineke ‘adịghị amata ọgaranya karịa onye na-enweghị ike, n’ihi na ọrụ aka ya ka ha nile bụ.’ (Job 34:19) Chineke hụrụ ụzọ ndị abụọ a n’anya n’ụzọ ha nhata.—Ọrụ 10:34, 35.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya