Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w03 12/1 p. 32
  • Olulu Mmiri Ndị Na-adịghị Anagide Mmiri

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olulu Mmiri Ndị Na-adịghị Anagide Mmiri
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
w03 12/1 p. 32

Olulu Mmiri Ndị Na-adịghị Anagide Mmiri

N’OGE Bible, olulu mmiri bụ olulu mmadụ gwuru karịsịa maka ichekwa mmiri. N’oge ụfọdụ, n’Ala Nkwa ahụ, ha bụ nanị ihe ndị e ji echekwa mmiri dị mkpa.

N’idekọ okwu ndị si n’ọnụ Chineke pụta, Jeremaịa onye amụma zoro aka n’olulu mmiri n’ụzọ ihe atụ, na-asị: “N’ihi na ihe ọjọọ abụọ ka ndị m meworo; Mụ ka ha hapụworo, bụ́ isi iyi nke mmiri na-enye ndụ, ka ha wee gwuwaara onwe ha olulu mmiri di iche iche, bụ́ olulu mmiri tipuru etipu nke na-anagideghị mmiri.”—Jeremaịa 2:13.

Ebe ha hapụworo Chineke ha, bụ́ Jehova—“isi iyi nke mmiri na-enye ndụ”—ndị Izrel tụkwasịrị obi ná njikọ agha a na-apụghị ịdabere na ha dị n’etiti ha na mba ndị na-ekpere arụsị, malitekwa ife chi ụgha ndị na-apụghị inye aka. Ụdị ebe ahụ e bu n’uche iji mere ebe mgbaba mechara bụrụ, n’iji ihe ya na ya yiri nke Jeremaịa ji kọwaa ya eme ihe, nanị olulu mmiri na-ehi ehi nke na-enweghị ike ichebe ma ọ bụ ịzọpụta.—Deuterọnọmi 28:20.

Ọ̀ dị ihe anyị pụrụ ịmụta taa n’ihe atụ a sitere n’akụkọ ihe mere eme? Dị ka ọ dị n’ụbọchị Jeremaịa, nanị Chineke ahụ nke na-adịru mgbe ebighị ebi, bụ́ Jehova, nọgidere na-abụ Isi Iyi nke mmiri na-enye ndụ. (Abụ Ọma 36:9; Mkpughe 4:11) Ọ bụ nanị site n’aka ya, site n’Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst, ka ụmụ mmadụ pụrụ inweta ndụ ebighị ebi. (Jọn 4:14; 17:3) Ma, dị ka ndị ha na Jeremaịa dịkọrọ ndụ, ọtụtụ n’ihe a kpọrọ mmadụ taa na-ahọrọ ịjụ na ọbụna ileda okwu Chineke e depụtara na Bible anya. Kama, ha na-adabere n’atụmatụ ndị ọchịchị yiri ka hà bara uru, echiche efu nke mmadụ, na n’echiche na nkà ihe ọmụma na-adịghị ewetara Chineke nsọpụrụ. (1 Ndị Kọrint 3:18-20; Ndị Kọlọsi 2:8) Nhọrọ ahụ doro anya. Ebee ka ị ga-atụkwasị obi? Ọ̀ ga-abụ “n’isi iyi nke mmiri na-enye ndụ,” bụ́ Jehova, ka ọ̀ ga-abụ ‘n’olulu mmiri tipuru etipu, nke na-adịghị anagide mmiri’?

[Foto dị na peeji nke 32]

Ihe a kpụrụ akpụ nke chi nwanyị a hụrụ n’ili otu onye Izrel

[Ebe E Si Nweta Foto]

Foto e sere site n’ikike nke Ebe Ndebe Ihe Ochie nke Britain

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya