Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w04 8/15 p. 3-4
  • Ezi Ndụmọdụ Ọ̀ Dị Mkpa?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ezi Ndụmọdụ Ọ̀ Dị Mkpa?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịchọta Ndụmọdụ Kasị Baa Uru
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • Ọ Bụrụ na Alụmdi na Nwunye Na-achọ Itisa
    Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ
  • Ihe Anọ I Kwesịrị Ịma Banyere Ịgba Alụkwaghịm
    Teta!—2010
  • ‘Gee Ntị n’Ihe Onye Ma Ihe Na-ekwu’
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
w04 8/15 p. 3-4

Ezi Ndụmọdụ Ọ̀ Dị Mkpa?

TAA, ọtụtụ mmadụ kweere na ha pụrụ ịma ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ nakwa na ha nweere onwe ha ime ihe ọ bụla masịrị ha. Ndị ọzọ na-ekwu na ihe ọ bụla dị mma ma ọ bụrụhaala na ọ na-eme ka mmadụ nwee obi ụtọ. Ọ na-enwe mmetụta dị njọ n’alụmdi na nwunye na ndụ ezinụlọ, bụ́ ihe ndị e leworo anya eri ogologo oge dị ka ntọala nke ọha mmadụ.—Jenesis 3:5.

Tụlee ihe banyere Verónica,a bụ́ onye bi na Mexico. Ọ na-akọ, sị: “Mgbe anyị lụworo di na nwunye ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 15, di m gwara m na ya na nwanyị ọzọ na-eme enyi. O kwuru na ebe ọ bụ na nwanyị a bụ nwa agbọghọ karịa m ma na-eme ya obi ụtọ karị na ya agaghị ahapụ ya. Ọ wụrụ m akpata oyi na ezigbo enyi m agaghịzi anọnyere m ọzọ. M na-echebu na ọnwụ nke ndị anyị hụrụ n’anya bụ ihe kasị akpata ihe mgbu. Ma nye m, ịkwa iko nke di m na-egbu m mgbu ọbụna karị n’ihi na ọ bụghị nanị na onye m hụrụ n’anya nke ukwuu hapụrụ m kama ọ nọgidere na-eme ihe na-agbawa m obi.”

E nwekwara otu nwoke gbara afọ 22 bụ́ onye gbaworo alụkwaghịm nke nwere otu nwa nwoke ma ọ dịghị njikere ịnakwere ibu ọrụ ya dị ka nna. Ọ na-atụ anya ka nne ya na-elekọta ya na nwa ya. Ọ bụrụ na nne ya emezughị ihe nile ọ chọrọ, ọ na-ewe oké iwe ma na-akparị ya, dị nnọọ ka nwa na-enweghị ezi àgwà. Nne ya amakwaghị ihe ọ ga-eme n’ihi àgwà mkparị dị otú ahụ.

Ọnọdụ ndị a abụghị ihe ndị a na-adịghị ahụkebe. Nkewa na alụkwaghịm a na-eme n’ụlọikpe na-arịwanye elu n’ebe nile. Ọtụtụ ụmụaka na-ahụ ka otu n’ime ndị mụrụ ha na-ahapụ ụlọ iji malite ndụ ọhụrụ. Ụfọdụ ndị na-eto eto adịghị akwanyere ndị ọzọ ùgwù, gụnyere ndị mụrụ ha, ha na-etinyekwa aka n’omume ndị a na-agatụghị echeta n’echiche n’oge ndị gara aga. Ịnwale mmekọahụ, ịṅụ ọgwụ ọjọọ, mwakpo sitere n’aka ndị ntorobịa na ụmụaka igbu ndị nkụzi ma ọ bụ ndị nne na nna ha aghọwo ihe a na-ahụkarị n’ọtụtụ ala. Ị pụkwara ịhụwo na ọzụzụ nke ụmụaka na alụmdi na nwunye abụghị nanị akụkụ ndị a na-enwe ihe isi ike na ha n’ụwa nke taa.

Ka anyị na-ahụ ihe ndị a na-emenụ, anyị pụrụ ịdị na-eche ihe meworo ọha mmadụ. Ọ bụrụ n’ezie na ndị mmadụ ma ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ, gịnị mere na e dozibeghị ọtụtụ nsogbu? È nwere mkpa maka ezi ndụmọdụ? È nwere isi iyi nke ndụmọdụ bara uru dị otú ahụ, nke gosiworo onwe ya ịbụ ihe a pụrụ ịtụkwasị obi? Ọ bụ ezie na ọtụtụ na-ekwu na ha kwere na Chineke na Okwu ya e dere ede, nke a eyighị ka ọ̀ na-emetụta mkpebi ha. Ma uru ndị dị aṅaa ka anyị pụrụ irite mgbe anyị na-achọ ma na-anata ndụmọdụ site n’aka Chineke? Ka anyị tụlee nke ahụ n’isiokwu na-esonụ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a A gbanweela aha ahụ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya