“Ọ Bụ Ihe Kasị Mma Pụrụ Imere Gị”
ALEXIS bụ nwatakịrị nwoke dị afọ ise bi n’obodo Morelia, Mexico, bụ́ onye ndị mụrụ ya na-amụ Bible ma na-aga nzukọ Ndịàmà Jehova. Mgbe ya na ezinụlọ ya gara otu mgbakọ sekit, ọ hụrụ ihe ngosi e mere banyere ime nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Ozugbo ahụ ọ tụgharịrị chee nna ya ihu ma jụọ, sị, “Papa, Papa, gịnị mere ị naghị aga eme nkwusa?” Nna ya zara, sị, “M ka na-amụ ihe ka m wee nwee ike ime nke ahụ.” Alexis ji ịnụ ọkụ n’obi zaghachi, sị, “Papa, ọ bụ ihe kasị mma pụrụ imere gị.”
Nwatakịrị a hụrụ mkpa ọ dị mmadụ ime ihe kwekọrọ n’ihe ọmụma o nwere banyere Jehova. Ebe ọ bụ na ha na ụfọdụ n’ime ụmụ nwanne mama ya ka bụ́ ụmụaka bi n’otu ụlọ, o bu ụzọ kpegara Jehova ekpere ma gwazie ha banyere ihe ndị ọ mụtara n’akwụkwọ bụ́ Akwukwọm nke Akukọ Bible site n’enyemaka nke ndị mụrụ ya. Ọ bụ ezie na Alexis amụtabeghị otú e si agụ ihe, ọ maara ihe dị n’akwụkwọ ahụ nke ọma site n’ihe osise ndị kọwara akụkọ ndị dị n’ime ya. Ọbụna o kwuru na ya chọrọ ileta ndị mmadụ n’ebe obibi ha ịgwa ha ihe ndị ọ na-amụta banyere nzube Chineke.
N’ezie, ma ndị na-eto eto ma ndị agadi pụrụ ime ka ndụ ha kwekọọ n’ihe Jehova, bụ́ “Onye Nsọ,” chọrọ n’aka ha, si otú a nwee ihe ùgwù kasịnụ nke ịgba àmà banyere ya n’etiti mba nile. (Aịsaịa 43:3; Matiu 21:16) N’ezie, nke ahụ bụ otu n’ime ihe ndị kasị mma pụrụ imere mmadụ.