Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w05 1/15 p. 32
  • “Olee Otú I Si Zụọ Ha?”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Olee Otú I Si Zụọ Ha?”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
w05 1/15 p. 32

“Olee Otú I Si Zụọ Ha?”

AJỤJỤ a otu agadi nwoke ọ na-amabughị jụrụ Muriel, bụ́ nne nke ụmụ atọ, n’ebe a na-ere nri onye ọ dị ngwa ngwa, dara ya na mberede. Muriel kpọ ụmụ ya gaa ná nke dọkịta, oge ganahụkwara ya. Oge adịghịrị ha ịlaru ụlọ ma rie nri ehihie tupu ha agawa nzukọ Ndị Kraịst ha. N’ihi ya, ọ kpọọrọ ụmụ ya gaa n’otu ụlọ nri dị nso ka ha wee nwee ike iri ihe.

Ka ha na-erisị nri ha, otu nwoke bịakwutere Muriel ma kwuo, sị: “Anọwo m na-ele unu kemgbe unu batara ebe a. Ahụwo m ọdịiche dị ukwuu n’etiti ụmụ gị na ụmụaka ndị ọzọ m na-ahụkarị. Ị hụ ihe ụmụaka na-eme tebụl na oche. Ha ga-achịkwasị ụkwụ ha n’elu tebụl. Na-akpụgharị oche. Ma ụmụ gị nọ nnọọ nwayọọ ma na-akpa ezi àgwà. Olee otú i si zụọ ha?”

Muriel zaghachiri, sị: “Mụ na di m na-amụrụ ụmụ anyị Bible mgbe nile, anyị na-agbalịkwa itinye ihe ndị anyị na-amụta n’ọrụ ná ndụ anyị. Anyị bụ Ndịàmà Jehova.” Mgbe ahụ, nwoke ahụ kwuru, si: “Abụ m onye Juu nke lanahụrụ Oké Mgbukpọ ahụ. Echetara m na m hụrụ ka a na-akpagbu Ndịàmà Jehova na Germany. Ọbụna mgbe ahụ, ha guzopụrụ iche. Omume ụmụ gị amasịla m nnọọ. Aghaghị m ileba anya n’okpukpe unu.”

Bible bụ akwụkwọ nduzi kachasị mma n’ịzụlite ụmụaka. Ndịàmà Jehova nwere mmasị dị ukwuu n’inyere ndị ọzọ aka irite uru site ná nduzi a na-achọta n’Akwụkwọ Nsọ. Anyị ji obi ụtọ na-akpọ gị òkù ime ihe e kwuru n’okpuru ebe a.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya