A Kwụghachiri Ha Ụgwọ Maka Ogologo Njem Ha Mere
ANYỊ si Democratic Republic of Congo nweta akụkọ banyere ụmụ nwanyị abụọ otu nne ji, bụ́ ndị kpebiri ime ogologo njem n’ebe agha tisasịrị iji gaa Mgbakọ Distrikti “Nye Chineke Otuto” na Lisala. E wezụga ịtụ anya inweta ntụziaka ime mmụọ na iso ụmụnna ha nwee mmekọrịta ná mgbakọ ahụ, ha tụrụ anya ịhụ ndị nnọchianya ga-esi n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Kinshasa bịa. N’ihi agha obodo a na-alụ ná mba ahụ, ha ahụbeghị onye ọ bụla si n’alaka ụlọ ọrụ ahụ eri ọtụtụ afọ, ha chọkwara iji ohere a mee otú ahụ.
Ụmụnne abụọ ahụ ji ụgbọ epeepe si obodo ha bụ́ Basankusu gaa Lisala, bụ́ njem dị ihe dị ka narị kilomita atọ nke ga-eme ka ha gafere oké ọhịa na osimiri abụọ. Njem ahụ were ha izu atọ. Ebe ha abụọ bụ ndị ozi oge nile, otu ejeela ozi ruo afọ 3 nke ọzọ ruo afọ 19, ha ji ohere ahụ ha ji na-eme njem kwusaa ozi ọma Alaeze ahụ. Ha ji otu narị awa na iri zie ndị ha zutere n’ụzọ ozi ọma, nyefee narị traktị abụọ na magazin 30.
Ka ha na-aga n’osimiri, ha aghaghị ịgafe enyi mmiri na agụ iyi ndị na-apụtakarị n’ebe ahụ. Ha apụghị ime njem n’osimiri ahụ n’abalị—a naghị aga ebe ahụ aga ma chi jie! Ha gafekwara ọtụtụ ebe ndị agha na-enyocha ndị mmadụ.
Ọ bụ ezie na njem a dị nnọọ ogologo ma na-agwụ ike, obi dị ụmụnne abụọ ahụ ụtọ na ha mere mgbalị ahụ ha mere. Ha abụọ nwere obi ekele na ọṅụ dị ukwuu na ha jere mgbakọ ahụ e nwere na Lisala. Ha na-anụrụ eziokwu ahụ ọkụ n’obi, mmekọrịta nke ha na ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ndị bịaranụ bụ́ ndị dị puku asaa gbakwara ha ume. Mgbe mgbakọ ahụ gasịrị, ha chekwara ihe ịma aka ndị ahụ ihu mgbe ha na-ala ala ma lọkwute ndị ezinụlọ ha ná ndụ nakwa n’ahụ́ ike.