Bible German Mbụ Jiri Aha Chineke Mee Ihe
EZIGBO aha Chineke, bụ́ Jehova, pụtara ọtụtụ puku ugboro na New World Translation of the Holy Scriptures, bụ́ nke e bipụtara n’asụsụ German n’afọ 1971.a Ma nke a abụghị Bible German mbụ ji aha Chineke mee ihe. O yikarịrị ka ọ̀ bụ Johann Eck, bụ́ ọkà mmụta okpukpe a ma ama nke Roman Katọlik, bipụtara Bible German mbụ ji aha Jehova mee ihe n’ihe dị ka narị afọ ise gara aga.
A mụrụ Johann Eck n’afọ 1486 n’ebe ndịda Germany. Mgbe ọ na-erula afọ 24, ọ ghọrọ prọfesọ nkà mmụta okpukpe na mahadum Ingolstadt, bụ́ ọkwá ọ nọ na ya ruo mgbe ọ nwụrụ n’afọ 1543. Eck na Martin Luther tokọrọ, ha abụọ bụkwara enyi ruo oge ụfọdụ. Otú ọ dị, Luther mesịrị ghọọ onyeisi n’òtù chọrọ ka a gbanwee ụfọdụ n’ime ozizi Chọọchị Katọlik, ebe Eck bụ onye na-agbachitere Chọọchị Katọlik.
Onyeisi obodo Bavaria nyere Eck ọrụ ịsụgharị Bible gaa n’asụsụ German, e bipụtakwara nsụgharị ahụ n’afọ 1537. Dị ka otu akwụkwọ si kwuo, nsụgharị ya gbasoro nnọọ ihe odide mbụ ahụ, ‘e kwesịkwara ịnabata ya karịa ka a na-eme.’ Eck si otú a sụgharịa Ọpụpụ 6:3: “Abụ m Onyenwenụ, nke pụtara n’ihu Ebram, Aịzik, na Jekọb n’ime Chineke nke Pụrụ Ime Ihe Nile: aha m bụkwa Adonai, emebeghị m ka ha mata ya.” Eck gbakwụnyere okwu na-esonụ n’akụkụ peeji ebe amaokwu ahụ dị: “Aha ahụ bụ Adonai Jehoua.” Ọtụtụ ndị ọkà mmụta Bible kwere na nke a bụ nke mbụ e ji ezigbo aha Chineke mee ihe na Bible German.
Otú ọ dị, o ruwo ọtụtụ puku afọ a matara ezigbo aha Chineke ma jiri ya na-eme ihe. Ọ bụ n’asụsụ Hibru ka e bu ụzọ dee ya ede, bụ́ ebe a kpọrọ nanị ezi Chineke ahụ “Jehova.” (Deuterọnọmi 6:4) Ọ bụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ puku afọ abụọ gara aga ka e dekọrọ n’asụsụ Grik, okwu Jizọs kwuru bụ́ na ya onwe ya mere ka a mara aha Chineke. (Jọn 17:6) Kemgbe ahụ, e bipụtawo aha ahụ n’ọtụtụ asụsụ, n’oge na-adịghịkwa anya, ná mmezu nke Abụ Ọma 83:18, mmadụ nile ga-amara na onye ahụ nke aha ya bụ Jehova bụ Onye kachasị ihe nile elu n’elu ụwa nile.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Nke Ndịàmà Jehova bipụtara na nke mbụ ya n’asụsụ Bekee n’afọ 1961. E nwere ya ugbu a n’ozuzu ya ma ọ bụ n’akụkụ ya ụfọdụ n’ihe karịrị asụsụ iri ise.
[Foto dị na peeji nke 32]
Bible Eck nke e bipụtara n’afọ 1558, bụ́ nke nwere ihe odide n’akụkụ peeji ebe aha ahụ bụ́ Jehova pụtara n’Ọpụpụ 6:3