Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w06 9/15 p. 2-3
  • Gịnị Bụ ‘Ụbọchị Ikpeazụ’?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Bụ ‘Ụbọchị Ikpeazụ’?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ànyị Na-ebi “n’Ụbọchị Ikpeazụ”?
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Oge Ikpeazụ—Olee Mgbe Ọ Ga-abụ?
    Teta!—2008
  • A Mụwo Alaeze Chineke!
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
  • Enyi Anyị Kasị Mma Nọ n’Ógbè Ndị Mmụọ
    Teta!—1996
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
w06 9/15 p. 2-3

Gịnị Bụ ‘Ụbọchị Ikpeazụ’?

Ọ̀ DỊ mgbe ị na-eche ihe ga-abụ ọdịnihu gị na nke ndị ikwu na ibe gị? Ọtụtụ ndị na-atọ ntị n’ala mgbe a na-akọ akụkọ ụwa iji mara otú ihe ndị na-eme n’ụwa nwere ike isi metụta ndụ ha. Otú ọ dị, ige ntị n’Okwu Chineke e dere n’ike mmụọ nsọ ga-eme ka anyị ghọta ihe ndị na-emenụ nke ọma. Nke ahụ bụ n’ihi na ogologo oge gara aga, Bible buru amụma banyere ihe ndị na-eme ugbu a, nakwa ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu.

Dị ka ihe atụ, mgbe Jizọs Kraịst nọ n’ụwa, o kwuru ọtụtụ ihe banyere Alaeze Chineke. (Luk 4:43) Ọ bụghị ihe ijuanya na ndị nụrụ ihe o kwuru chọrọ ịma mgbe Alaeze ọma ahụ ga-abịa. N’ezie, abalị atọ tupu e kpee Jizọs ikpe na-ezighị ezi ma gbuo ya, ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya, sị: “Gịnị ga-abụkwa ihe ịrịba ama nke ọnụnọ gị [dị ka Eze nke Alaeze ahụ] nakwa nke ngwụsị nke usoro ihe a?” (Matiu 24:3) Jizọs gwara ha na ọ bụ nanị Jehova Chineke maara kpọmkwem mgbe Alaeze ahụ ga-amalite ịchị ụwa n’ụzọ zuru ezu. (Matiu 24:36; Mak 13:32) Otú ọ dị, Jizọs na ndị ọzọ buru amụma banyere ihe ụfọdụ ọ ga-abụ ha mewe n’ụwa, anyị amara na Kraịst achịwala dị ka Eze nke Alaeze ahụ.

Tupu anyị atụlee ihe ndị a na-ahụ anya na-egosi na anyị bi “n’ụbọchị ikpeazụ” nke ụwa dị ugbu a, ka anyị tụletụ otu ihe dị mkpa mere n’eluigwe. (2 Timoti 3:1) Jizọs Kraịst ghọrọ Eze n’eluigwe n’afọ 1914.a (Daniel 7:13, 14) Ozugbo e chisịrị Jizọs Eze nke Alaeze ahụ, ọ dị ihe o mere. Bible na-agwa anyị, sị: “Agha wee daa n’eluigwe: Maịkel na ndị mmụọ ozi ya busoro dragọn ahụ agha, dragọn ahụ na ndị mmụọ ozi ya bukwara agha.” (Mkpughe 12:7) “Maịkel onyeisi ndị mmụọ ozi” bụ Jizọs Kraịst n’eluigwe.b (Jud 9; 1 Ndị Tesalonaịka 4:16) Dragọn ahụ bụ Setan bụ́ Ekwensu. Olee ihe mere Setan na ajọ ndị mmụọ ozi ya a na-akpọ ndị mmụọ ọjọọ n’agha ahụ? E meriri ha ma si n’eluigwe chụpụ, ma ọ bụ ‘chụda,’ ha n’ụwa. (Mkpughe 12:9) N’ihi nke a, “eluigwe nile na [ndị] bi n’ime ha,” ya bụ, ụmụ Chineke bụ́ ndị mmụọ ozi kwesịrị ntụkwasị obi, ṅụrịrị ọṅụ. Otú ọ dị, ụmụ mmadụ enwebeghị ụdị aṅụrị dị otú ahụ. Bible buru amụma, sị: “Ahụhụ ga-adịrị ụwa, . . . n’ihi na Ekwensu arịdakwuruwo unu, na-ewe oké iwe, ebe ọ maara na o nwere oge dị mkpirikpi.”—Mkpughe 12:12.

N’ihi iwe ji Setan, ọ kpatarala ndị bi n’ụwa ahụhụ—ihe isi ike na mkpagbu. Otú ọ dị, ahụhụ ahụ agaghị adịte aka, ọ ga-adịru “oge dị mkpirikpi.” Bible kpọrọ oge a ‘ụbọchị ikpeazụ.’ Anyị pụrụ inwe obi ụtọ na n’oge na-adịghị anya Ekwensu ga-akwụsị nnọọ ịchị ụwa. Ma olee ihe ndị na-egosi na anyị bi n’ụbọchị ikpeazụ?

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Lee Ụlọ Nche nke July 15, 2006, peeji nke 6-7.

b Iji nwetakwuo nkọwa, lee akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? peeji nke 218-219, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Ebe e si Nweta Foto dị na peeji nke 2]

IHU AKWỤKWỌ: Foto: © Chris Stowers/⁠Panos Pictures; azụ foto: FAROOQ NAEEM/⁠AFP/⁠Getty Images

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya