Daniel Na Baajị Mgbakọ Ya
JIZỌS baara ndị ndú okpukpe bụ́ ndị ezi omume n’anya onwe ha mba mgbe ha were iwe ka ha hụrụ ka ụmụaka na-eto Chineke n’ihu ọha. Jizọs jụrụ ha ajụjụ kwesịịrị ha, sị: “Ọ̀ bụ na unu agụtụbeghị nke a, ‘Site n’ọnụ ụmụ ọhụrụ na ụmụ na-aṅụ ara ka i meworo ka otuto pụta’?”—Matiu 21:15, 16.
Daniel dị afọ isii, bụ́ onye so ọgbakọ dị na Germany bụ́ nke na-eji asụsụ Russia eme ihe, mere ihe gosiri na ụmụaka ka na-eto Jehova. O so mama ya na nwanne ya nwanyị gaa mgbakọ distrikti Ndịàmà Jehova nwere na Duisburg. Nke a bụ nke mbụ ha na-aga mgbakọ buru ibu otú ahụ. Ihe nile ha hụrụ ebe ahụ yiri ha ihe ọhụrụ: họtel ha nọrọ na ya, ìgwè mmadụ bịara mgbakọ ahụ, ịnọ ọdụ otu ebe ruo ụbọchị atọ, baptizim, tinyekwara ihe nkiri e mere ná mgbakọ ahụ. Oleekwanụ otú Daniel si kpaa àgwà? Àgwà ya kwesịrị nṅomi.
Na Monday sochiri ụbọchị e mechara mgbakọ ahụ, Daniel bilitere n’isi ụtụtụ ma kwadebe ịga ụlọ akwụkwọ ọta akara. Ma baajị mgbakọ ya ka nọ ya n’uwe. Mama ya gwara ya, sị: “Emechaala mgbakọ. Ị pụrụ iyipụ baajị gị taa.” Ma Daniel kwuru, sị: “Achọrọ m ka mmadụ nile mara ebe m gara na ihe m mụtara.” O yiri nnọọ baajị ahụ n’ụbọchị ahụ nile n’ụlọ akwụkwọ. Mgbe onye nkụzi ha jụrụ ya ajụjụ banyere baajị ahụ o yi, ọ kọwaara ya ihe ndị e mere ná mgbakọ ahụ.
Ihe a Daniel mere gosiri na ọ gbasoro ihe nlereanya nke ọtụtụ puku ụmụaka bụ́ ndị toro Jehova n’ihu ọha n’ọtụtụ narị afọ ndị gara aga.