Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w07 2/15 p. 32
  • Ihe Nlereanya nke Ime Ihe n’Eziokwu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Nlereanya nke Ime Ihe n’Eziokwu
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
w07 2/15 p. 32

Ihe Nlereanya nke Ime Ihe n’Eziokwu

NELMA, bụ́ onye na-arụ ọrụ dị ka onye na-edozi isi n’obodo Cruzeiro do Sul, Brazil, nwetara ule nke ịkwesị ntụkwasị obi dị ka Onye Kraịst na nso nso a. Mgbe idei mmiri kpara ebe Nelma bi aka ọjọọ, otu n’ime ụmụ nwanyị ọ na-eme isi nyetụrụ ya ákwà ụfọdụ. Ka ọ nọ na-enyocha ákwà ndị ahụ, ọ hụrụ ego ruru otu puku dọla (U.S.) n’ime akpa traụza ụfọdụ.

Ego ahụ Nelma chọtara ruru ụgwọ ọnwa asaa ya, ego ahụ dịkwanụ ya mkpa. Idei mmiri ahụ mebiri ụlọ ya, ọtụtụ ihe ndị nna ya na ụmụnne ya nwere funahụkwara ha. Ọ ga-enwe ike iji ego ahụ rụzie ụlọ ya, ya afọkwa nke ọ ga-eji nyere ndị ikwu ya aka. Ma, akọnuche Nelma e ji Bible zụọ ekweghị ya ka o were ego ahụ.—Ndị Hibru 13:18.

N’ụtụtụ echi ya, ọ mara ụzọ gaa ọrụ ma gakwuru nwanyị ahụ na-achụ nta ego bụ́ onye nyere ya ákwà ndị ahụ. Nelma kelere ya maka ákwà ndị ahụ, ma gwakwa ya na obi ekweghị ya were ihe ya hụrụ n’ime ákwà ndị ahụ. Nwanyị ahụ nwere ọṅụ dị ukwuu n’ego ahụ o nwetara. O wepụtara ego ahụ iji kwụọ ndị ọrụ ya ụgwọ. O kwuru, sị: “Ọ na-ara ahụ́ ịhụ onye na-eme ihe n’eziokwu.”

N’ezie, ụfọdụ nwere ike iche na ọ dịghị uru pụrụ iche mmadụ na-erite n’ime ihe n’eziokwu. Ma, ime ihe n’eziokwu bụ àgwà dị oké mkpa nye ndị na-agbalị ime ihe ga-atọ ezi Chineke bụ́ Jehova ụtọ. (Ndị Efesọs 4:25, 28) Nelma kwuru, sị: “Agaaraghị m ehili ụra abalị ma a sị na m weere ego ahụ.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya