Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w07 8/15 p. 32
  • Ide Ihe—Mkpa Ọ Dị n’Izrel Oge Ochie

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ide Ihe—Mkpa Ọ Dị n’Izrel Oge Ochie
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
w07 8/15 p. 32

Ide Ihe—Mkpa Ọ Dị n’Izrel Oge Ochie

Ị̀ GỤỌLA Iliad ma ọ bụ Odyssey, bụ́ akwụkwọ abụọ a ma ama kọrọ akụkọ banyere Gris oge ochie? E chere na e dere ha na narị afọ nke itoolu ma ọ bụ na narị afọ nke asatọ T.O.A. Olee otú akwụkwọ ndị a dị ma e jiri ha tụnyere Bible, bụ́ nke a malitere ide ọtụtụ narị afọ tupu mgbe ahụ? Akwụkwọ bụ́ The Jewish Bible and the Christian Bible kwuru, sị: “Bible kwuru banyere ide ihe na akwụkwọ ndị e dere ede ya dịkarịala ala narị ugboro anọ na iri abụọ na itoolu. Nke a dị ịtụnanya ma ọ bụrụ na mmadụ echeta na Iliad kwuru banyere ide ihe nanị otu ugboro, ebe Odyssey na-ekwukwanụghị ihe ọ bụla banyere ide ihe.”

Akwụkwọ bụ́ The Oxford Encyclopedia of Archaeology in the Near East kọwara na “n’Izrel oge ochie, o yiri ka ide ihe ọ̀ bụ otu n’ime ihe ndị bụ́ isi okpukpe na-akụziri ndị mmadụ.” Dị ka ihe atụ, e dere ọgbụgba ndụ Iwu ahụ ede, mesịakwa na-agụrụ ya ndị ikom, ndị inyom na ụmụaka nile n’ihu ọha mgbe nile. Ndị mmadụ n’otu n’otu na ndị gbakọtara n’ìgwè n’ìgwè gụkwara ha ma mụọ ha. Mgbe Alan Millard, bụ́ nnukwu onye nkụzi na Mahadum Liverpool, tụlechara akụkụ ụfọdụ nke Iwu ahụ, o kwubiri, sị: “O doro anya na ndị dere Bible kweere na ihe ka ọtụtụ ná ndị Izrel maara otú e si agụ ihe na otú e si ede ihe.”—Deuterọnọmi 31:9-13; Joshua 1:8; Nehemaịa 8:13-15; Abụ Ọma 1:2.

Pọl onyeozi kọwara otú Ndị Kraịst kwesịrị isi na-ele ihe odide ndị dị nsọ anya, sị: “Ihe nile e dere tupu oge ha eruo ka e dere iji nye anyị ntụziaka, ka anyị wee site ná ntachi obi anyị na site ná nkasi obi sitere n’Akwụkwọ Nsọ nwee olileanya.” Ị̀ na-egosi na gị onwe gị ji Bible kpọrọ ihe site n’ịgụchi ya anya?—Ndị Rom 15:4.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya