Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w07 12/1 p. 31
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Ije Ozi Dị Ka Ndị Ọkụ Na-akụta Mmadụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Ịkụta Mmadụ ná Mmiri Ụwa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Ịkụ Azụ̀ n’Oké Osimiri Galili
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
w07 12/1 p. 31

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Olee otú Onye Kraịst kwesịrị isi na-ele ịchụ nta na igbu azụ̀ anya?

Bible akatọghị mmadụ ịchụ nta ma ọ bụ igbu azụ̀. (Deuterọnọmi 14:4, 5, 9, 20; Matiu 17:27; Jọn 21:6) Ma, Ndị Kraịst na-achụ nta ma ọ bụ na-egbu azụ̀ kwesịrị ichebara ọtụtụ ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru banyere okwu a echiche.

Chineke nyere Noa na ụmụ ya ikike igbu ụmụ anụmanụ na iri anụ ha, ma ọ bụrụhaala na ha gbupụrụ ha ọbara tupu ha eriwe ha. (Jenesis 9:3, 4) Ntụziaka ahụ mere ka o doo anya na e kwesịrị ịkwanyere ndụ ụmụ anụmanụ ùgwù n’ihi na o sitekwara n’aka Chineke. N’ihi ya, Ndị Kraịst adịghị egbu ụmụ anụmanụ dị ka ihe egwuregwu na-akwanyereghị ndụ ha ùgwù.—Ilu 12:10.

Ihe ọzọ anyị ga-echebara echiche n’okwu a bụ otú anyị si ele ihe ndị a anya. O yiri ka obi ọ̀ tọrọ ndịozi bụ́ ndị ọkụ azụ̀ ụtọ mgbe ha gbutere azụ̀ buru ibu. Ma e nweghị ihe gosiri na ha ji azụ̀ ha gbutere ma ọ bụ anụ ndị ha chụtara ná nta tuo ọnụ. Ọ dịghịkwa ihe gosiri na ha gara igbu azụ̀ ma ọ bụ ịchụ nta iji mara hà na ndị ọzọ ndị ka ike ma ọ bụ iji mara onye bụ́ nwoke, ma ọ bụkwanụ n’ihi obi ụtọ ha na-enweta n’ịchụgharị ụmụ anụmanụ ma ọ bụ n’igbu ha.—Abụ Ọma 11:5; Ndị Galeshia 5:26.

N’ihi ya, anyị pụrụ ịjụ onwe anyị, sị: ‘M̀ na-esetịpụ ihe nlereanya n’ile ndụ anya otú Jehova si ele ya? Ihe m na-eche ma ọ bụ na-ekwu okwu ya mgbe nile ọ̀ bụ banyere ịchụ nta na igbu azụ̀? Ọ̀ na-atọ m ụtọ ịdị na-achụgharị ma na-egbu ụmụ anụmanụ, ka m̀ na-egosi na m bụ onye na-ejere Chineke ozi? Ịchụ nta na igbu azụ̀ ọ̀ na-eme ka mụ na ndị na-ekweghị ekwe na-anọkarị ma ọ bụ mee ka m na-eleghara ezinụlọ m anya?’—Luk 6:45.

Ndị na-achụ nta na ndị na-egbu azụ̀ pụrụ ile ya anya na ọ dịghị ihe o mere ma ha leghara ihe ime mmụọ anya ma ọ manye n’oge a na-achụ nta ma ọ bụ n’oge a na-egbu azụ̀. Ma, anyị na-egosi na anyị nwere okwukwe na Chineke ma tụkwasị ya obi mgbe anyị jụrụ ikwe ka ihe ọ bụla bute ihe metụtara Chineke ụzọ. (Matiu 6:33) Tụkwasị na nke ahụ, Ndị Kraịst na-erube isi n’iwu “Siza” nyere banyere ịchụ nta na igbu azụ̀ ma ndị na-ahụ maka iwu ndị a hà na-agbalị ịhụ na ndị mmadụ na-edebe ha ma ọ bụ na ha adịghị eme otú ahụ.—Matiu 22:21; Ndị Rom 13:1.

Iji mee ihe kwekọrọ n’otú Jehova si ele ịchụ nta na igbu azụ̀ anya, ọ pụrụ ịdị mkpa ka ụfọdụ gbanwee otú ha si ele ihe ndị Bible kwuru banyere okwu a anya. (Ndị Efesọs 4:22-24) Ma, anyị kwesịkwara ịkwanyere mkpebi ndị ọzọ mere, bụ́ nke akọ na uche ha nabatara, ùgwù. Ndụmọdụ Pọl onyeozi nyere dabara nnọọ adaba n’okwu a. Ọ sịrị: “Ka anyị kwụsị ịdị na-ekpe ibe anyị ikpe, ma kama nke ahụ, meenụ ka nke a bụrụ mkpebi unu, na unu agaghị edebe ihe ịsụ ngọngọ ma ọ bụ ihe na-akpata mkpọbi ụkwụ n’ihu nwanna.” (Ndị Rom 14:13) Isi otú a na-egosi na anyị hụrụ ndị ọzọ n’anya ma na-akwanyere ha ùgwù na-eme ka udo dị n’ọgbakọ, ọ na-amasịkwa Onye kere anyị, bụ́ Onye ndụ sitere n’aka ya.—1 Ndị Kọrịnt 8:13.a

[Ihe e dere n’ala ala peeji nke]

a Leekwa “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ” n’Ụlọ Nche nke May 15, 1990.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya