Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w07 12/15 p. 32
  • “Onyinye ahụ Dị Oké Ọnụ Ahịa I Nyere M”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Onyinye ahụ Dị Oké Ọnụ Ahịa I Nyere M”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
w07 12/15 p. 32

“Onyinye ahụ Dị Oké Ọnụ Ahịa I Nyere M”

NKE ahụ bụ otú onye bụ́bu praịm minista mba Belgium si kọwaa akwụkwọ bụ́ Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ.a Otu onye agbata obi ya letara ya, ọ natakwara ya akwụkwọ ahụ. Mgbe e mesịrị, o degaara onye agbata obi ya ahụ akwụkwọ ozi ekele, sị: “Nleta i letara m masịrị m nnọọ, onyinye ahụ dị oké ọnụ ahịa i nyere m masịdịrị m karịa: ya bụ akwụkwọ ahụ kọwara ‘Nwoke ahụ Kasị Ukwuu.’”

Onye ahụ bụ́bu praịm minista tụlere akwụkwọ ahụ ma kwuo, sị: “A sị na ndị mmadụ ga-enwekwu mmasị n’Oziọma anọ ahụ ma tinye ụkpụrụ Jizọs Kraịst n’ọrụ, ụwa agatụghị adị otú ọ dị taa. Kansụl Nchebe agaghị adịkwa anyị mkpa; a gaghịkwa enwe mwakpo nke ndị na-eyi ọha egwu, ụwa agaghịkwa anabata ime ihe ike.” Ọ bụ ezie na o kwuru na nke a yiri ihe a na-arọ ná nrọ, o kwuru na ya ji ihe ọma ahụ onye agbata obi ya meere ya kpọrọ ihe.

Akwụkwọ ozi ahụ gara n’ihu na-ekwu, sị: “Ị nọ n’òtù ndị nwere obiọma bụ́ ndị na-anaghị enwe nchekwube gabiga ókè ma ọ bụ na-eche na ụwa enweghị mmekwata, kama nke ahụ, ha kweere na ihe ga-aka mma nakwa na ụmụ mmadụ ga-emezili àgwà ha.”

Ndịàmà Jehova kweere na Jehova, ọ bụghị ụmụ mmadụ, ga-emesị mee ka ụwa ka mma. Ha na-anwa iṅomi nwoke ahụ kasị ukwuu, bụ́ Jizọs Kraịst. Ndịàmà Jehova hà abịala na nke gị na nso nso a? Ikekwe, ọ ga-amasị gị ka ha kọọrọ gị ihe banyere nwoke ahụ kasị ukwuu nke dịworo ndụ. Obi ga-adịkwa ha ụtọ inye gị akwụkwọ ahụ masịrị nnọọ onye a bụ́bu praịm minista.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji nke]

a Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya