Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w08 4/1 p. 3-4
  • “Agha nke Ga-akwụsị Agha Niile”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Agha nke Ga-akwụsị Agha Niile”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Agha Ọgwụrụ Mba?
    Isiokwu Ndị Ọzọ
  • Agha Nuklia—À Ka Na-atụ Egwu Ya?
    Teta!—2004
  • Agha Nuklia—Olee Ndị Na-eyi Egwu Ya?
    Teta!—2004
  • Otú Chineke Si Ele Ịlụ Agha Anya n’Oge Anyị A
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
w08 4/1 p. 3-4

“Agha nke Ga-akwụsị Agha Niile”

‘M na-ekwe unu nkwa na agha a ga-abụ agha ikpeazụ—agha nke ga-akwụsị agha niile.’—WOODROW WILSON, ONYEISI ALA AMERICA (1913-1921).

NKE ahụ bụ ihe otu onye ndú ụwa tụrụ anya ya mgbe Agha Ụwa nke Mbụ biri, n’ihe dị ka afọ iri itoolu gara aga. Agha ahụ a lụrụ n’ụwa dum jọgburu onwe ya nke na ndị meriri n’agha ahụ kwenyesiri ike na mgbalị niile ha mere ga-eweta abamuru ga-adịte aka. Ma, o siri ike ịhụ ebe agha ụmụ mmadụ mere ka nsogbu kwụsị, ma ya fọdụzie ịkwụsị nsogbu na-adịghị ala ala agha na-akpata.

Mgbe ihe dị ka afọ iri abụọ onyeisi ala America bụ́ Wilson kwechara nkwa ahụ ọ na-echerughị echiche ala kwee, agha ụwa nke abụọ malitere. Ndị nwụrụ n’agha ahụ na ihe ndị e mebiri na ya karịrị nke agha ụwa nke mbụ. Afọ iri abụọ ndị mmadụ ji mụtakwuo nkà na ụzụ mere ka ha matakwuo otú e si egbukpọ ndị mmadụ n’ìgwè. Mgbe agha ụwa nke abụọ biri, ndị na-achị ụwa chọpụtara na agha nke a na-ahụtụbeghị ụdị ya nwere ike ịda mgbe ọ bụla.

N’afọ 1945, ọchịagha ndị America bụ́ Douglas MacArthur kwuru, sị: “Ihe a bụ ohere ikpeazụ anyị nwere ime ka agha kwụsị. Ọ bụrụ na anyị achọpụtaghị ihe ka mma anyị ga-eme, Amagedọn ga-ada.”

Ọchịagha bụ́ MacArthur maara ihe bọmbụ atọm abụọ mere n’obodo Nagasaki na Hiroshima mgbe ọ fọrọ ụbọchị ole na ole ka agha ụwa nke abụọ bie. Otú e si bibie obodo abụọ ahụ dị na Japan mere ka okwu bụ́ “Amagedọn” nwee nkọwa ọhụrụ, ya bụ, agha a ga-eji ngwá agha ọgwụrụ mba lụọ, nke nwere ike ibibi ihe niile dị n’ụwa.

Ụmụ mmadụ ka na-enwe nchegbu n’ihi agha ọgwụrụ mba nke nwere ike ịda. Tupu afọ 1970, mba ndị bụ́ dike chọpụtara ụzọ ha nwere ike isi nwee “ngwá agha ha ga-eji chere ndị iro ha.” Ebumnobi ha bụ inwe ọtụtụ mgbọ ogbunìgwè ma ọ bụ otú e si agbapụ mgbọ ogbunìgwè ndị ga-egbu otu ụzọ n’ụzọ anọ nke ndị na-abụghị ndị agha, bibiekwa ọkara ụlọ ọrụ niile na-arụpụta ihe ná mba ndị iro ha—n’agbanyeghị ndị malitere agha ahụ. Ọ bụ mmadụ ole na ole chere na nke a ga-eweta udo n’ụwa.

Taa, ngwá agha ọgwụrụ mba juru ebe niile, agha a na-alụ n’ebe dị iche iche na-egbu ọtụtụ mmadụ. Agha a ga-eji ngwá agha ọgwụrụ mba lụọ ka nwere ike ịda. Ọ bụ ezie na ọ na-agụ ndị mmadụ agụụ ka agha kwụsị, ọ bụ mmadụ ole na ole kweere na ọ bụ agha ma ọ bụ ndokwa ọzọ ụmụ mmadụ mere ga-eme ka o nwee isi.

Ma, Baịbụl kwuru na e nwere agha pụrụ iche nke ga-akwụsị agha niile. Ọ kpọrọ agha a “Amagedọn,” nke ndị mmadụ na-echekarị na ọ bụ agha a ga-eji ngwá agha ọgwụrụ mba lụọ. Olee otú Amagedọn ga-esi mee ka agha kwụsị? Isiokwu na-esonụ ga-aza ajụjụ a.

[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji nke 3]

Foto DTRA sere

[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji nke 4]

Nagasaki, Japan, 1945: foto USAF sere

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya