Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w08 5/15 p. 29
  • Otú E Si Hazie Òtù Na-achị Isi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Otú E Si Hazie Òtù Na-achị Isi
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ole Ndị Bụ Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova?
    Ajụjụ Ndị Mmadụ Na-ajụkarị Gbasara Ndịàmà Jehova
  • “Anyị Ji Otu Olu Kwekọrịta”
    ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
  • Ndị Ịhụnanya Mere Ka Ha Dị n’Otu—Akụkọ Banyere Nzukọ A Na-enwe Kwa Afọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • “Na-akwanyerenụ Ndị Dị Otú Ahụ Ùgwù”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
w08 5/15 p. 29

Otú E Si Hazie Òtù Na-achị Isi

NDỊ mejupụtara Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova bụ ụmụ nwoke e tere mmanụ raara onwe ha nye Chineke. Ha na-anọchi anya ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche, nke e nyere ọrụ inye ndị ohu Jehova nri ime mmụọ na iduzi ọrụ nkwusa Alaeze ahụ iji hụ na e kwusara ya n’ụwa niile.—Mat. 24:14, 45-47.

Òtù Na-achị Isi na-enwekarị nzukọ ha n’ụbọchị Wednesday nke izu ọ bụla. Nke a na-enyere ụmụnna ndị a aka ịdị na-arụkọ ọrụ ọnụ n’otu. (Ọma 133:1) Ndị so n’Òtù Na-achị Isi nọ na Kọmitii dị iche iche. Iji hụ na a na-elekọta ihe ndị metụtara Alaeze ahụ nke ọma, kọmitii nke ọ bụla nwere ọrụ nke ya. A kọwara ọrụ kọmitii nke ọ bụla n’okpuru ebe a.

◼ KỌMITII NHAZI: Ndị so na kọmitii a bụ ndị isi na-ahazi kọmitii ndị ọzọ dị iche iche nke Òtù Na-achị Isi, ha na otu odeakwụkwọ, onye sokwa n’Òtù Na-achị Isi. Kọmitii a na-ahụ na kọmitii ndị ọzọ na-arụ ọrụ nke ọma n’enweghị nsogbu ọ bụla. Ọ na-ahụkwa maka ihe mberede dapụtaranụ, mkpagbu, ọdachi, na ihe ndị ọzọ metụtara Ndịàmà Jehova n’ụwa niile, bụ́ ndị chọrọ ka e mee ihe ngwa ngwa maka ha.

◼ KỌMITII NDỊ ỌRỤ: Ọrụ ụmụnna so na kọmitii a bụ ịhụ maka mkpa anụ ahụ́ na nke ime mmụọ nke ndị ezinụlọ Betel n’ụwa niile, nakwa inyere ha aka n’ụzọ ndị ọzọ. Ọ bụ kọmitii a na-ahụ maka ịhọrọ na ịkpọ ndị ọhụrụ ga-eje ozi na Betel ma na-aza ajụjụ ọ bụla gbasara ozi ha na-eje na Betel.

◼ KỌMITII MBIPỤTA: Kọmitii a na-ahụ maka ibipụta akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl n’ụwa niile na ịhụ na e bugara ha n’ebe a chọrọ ha. Ọ bụ ya na-ahụ maka ebe ndị a na-anọ ebi akwụkwọ na ihe onwunwe nke ụlọ ọrụ dị iche iche Ndịàmà Jehova ji arụ ọrụ. Ọ bụ kọmitii a na-ahazi otú a ga-esi jiri ego ndị e nwetara maka ọrụ zuru ụwa ọnụ mee ihe n’ụzọ ga-akasị baa uru.

◼ KỌMITII IJE OZI: Ọ bụ kọmitii a na-ahụ maka ọrụ nkwusa na ihe ọ bụla metụtara ọgbakọ, ndị ọsụ ụzọ, ndị okenye, na ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị. Ọ na-ahụ maka ịkwadebe Ozi Alaeze Anyị, ọ bụkwa kọmitii a na-akpọ ndị ga-aga Ụlọ Akwụkwọ Gilead na Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi ma kenye ha ebe ha ga-eje ozi ma ha gụchaa.

◼ KỌMITII IZI IHE: Kọmitii a na-ahụ maka akwụkwọ ndị e ji ezi ihe ná mgbakọ ukwu na nke nta, nakwa n’ọmụmụ ihe ọgbakọ. Ọ na-ahazi nri ime mmụọ maka ndị ezinụlọ Betel, ọ bụkwa ha na-ahụ maka ụlọ akwụkwọ dị iche iche, dị ka Ụlọ Akwụkwọ Gilead na Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọsụ Ụzọ, ọ bụkwa ha na-akwadebe vidio ndị a na-egere naanị egere na ndị nke a na-ekiri ekiri.

◼ KỌMITII IHE ODIDE: Kọmitii a na-ahụ maka ihe a na-ede n’akwụkwọ ndị a na-ebipụtara ndị kwere ekwe ibe ha na ọhaneze, hụkwa na e kesara ha. Ọ bụ kọmitii a na-aza ajụjụ ọ bụla sitere na Baịbụl a jụrụ ma hụ na e wepụtara akwụkwọ e ji eme ihe nkiri na ndị nke e ji ekwu okwu ihu ọha. Ọ bụkwa ya na-ahụ maka ọrụ nsụgharị a na-arụ n’ụwa niile.

Pọl onyeozi ji ọgbakọ Ndị Kraịst e tere mmanụ tụnyere ahụ́ mmadụ ma kwuo ọrụ akụkụ ahụ́ nke ọ bụla na-arụ na otú nke ọ bụla si dị ibe ya mkpa, otú ha si hụ ibe ha n’anya nakwa otú ha si arụkọ ọrụ Chineke nyere ha ọnụ. (Rom 12:4, 5; 1 Kọr. 12:12-31) Jizọs Kraịst bụ́ Isi ahụ́ ahụ, na-enye akụkụ ahụ́ niile ihe dị mkpa iji hụ na ha na-arụkọ ọrụ ọnụ, na a haziri ha nke ọma, nakwa na ha na-eriju nri ime mmụọ afọ. (Efe. 4:15, 16; Kọl. 2:19) Otú a ka e si hazie Òtù Na-achị isi ka ha wee na-eduzi ọgbakọ nke ọma dị ka mmụọ nsọ Jehova si chọọ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya