Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w10 4/1 p. 5
  • Ihe Jizọs Kụziri Banyere Onwe Ya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Jizọs Kụziri Banyere Onwe Ya
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ònye Bụ Jizọs Kraịst?
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Ònye Bụ Jizọs Kraịst?
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
  • Azịza nke Ajụjụ Ndị A Na-ajụ Banyere Jizọs Kraịst
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Jizọs Kraịst Ònye Ka Ọ Bụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
w10 4/1 p. 5

Ihe Jizọs Kụziri Banyere Onwe Ya

“Jizọs anọtụghị ná mgbagwoju anya banyere onye ọ bụ, ebe o si bịa, ihe mere o ji bịa n’ụwa, na ihe na-eche ya n’ọdịnihu.”—ONYE EDEMEDE BỤ́ HABAT LỌKYA.

TUPU anyị ekwere ma nwee okwukwe n’ihe ndị Jizọs kụziri, ọ dị anyị mkpa ịma ihe banyere ya. Ònye ka Jizọs bụ n’ezie? Olee ebe o si bịa? Gịnị bụ nzube ya ná ndụ? N’Oziọma ndị dị na Baịbụl—Matiu, Mak, Luk, na Jọn—anyị ga-anụ azịza ha n’ọnụ Jizọs.

Ọ dịrị ndụ tupu a mụọ ya n’ụwa Ọ dị mgbe Jizọs kwuru, sị: “Tupu a mụọ Ebreham, mụ onwe m adịrịla ndụ.” (Jọn 8:58) Ebreham dịrị ndụ ihe dị ka puku afọ abụọ tupu a mụọ Jizọs. N’agbanyeghị nke ahụ, Jizọs dịdị ndụ tupu a mụọ nna ochie ahụ bụ́ onye ezi omume. Ma, olee ebe Jizọs bibu tupu ya abịa n’ụwa? O kwuru, sị: “Esi m n’eluigwe bịa.”—Jọn 6:38.

Ọkpara Chineke Jehova nwere ọtụtụ ụmụ bụ́ ndị mmụọ ozi. Ma, Jizọs pụrụ iche. Ọ kpọrọ onwe ya “Ọkpara Chineke mụrụ naanị ya.” (Jọn 3:18) Okwu ahụ pụtara na Jizọs bụ naanị onye Chineke kere n’onwe ya. Ọ bụ Ọkpara a a mụrụ naanị ya ka Chineke ji kee ihe ndị ọzọ niile.—Ndị Kọlọsi 1:16.

“Nwa nke mmadụ” Jizọs kpọrọ onwe ya aha a karịa aha ọ bụla ọzọ. (Matiu 8:20) O si otú a gosi na ya abụghị mmụọ ozi nwoghara enwogha ma ọ bụ Chineke bịara n’anụ ahụ́. Kama nke ahụ, ọ bụ nnọọ mmadụ. Chineke ji mmụọ nsọ ya si n’eluigwe budata ndụ Ọkpara ya n’ụwa, mee ka nwa agbọghọ na-amaghị nwoke bụ́ Meri dịrị ime. N’ihi ya, a mụrụ Jizọs dị ka mmadụ zuru okè nke na-enweghị mmehie ọ bụla.—Matiu 1:18; Luk 1:35; Jọn 8:46.

Mesaya e kwere ná nkwa Otu nwaanyị Sameria gwara Jizọs, sị: “Amaara m na Mesaya na-abịa.” Jizọs sịrị ya: “Ọ bụ mụ onwe m nke na-agwa gị okwu bụ ya.” (Jọn 4:25, 26) Okwu ahụ bụ́ “Mesaya” na okwu bụ́ “Kraịst” pụtara “Onye E Tere Mmanụ.” Chineke tere Jizọs mmanụ, ma ọ bụ họpụta ya, ịrụ ọrụ pụrụ iche iji mezuo nkwa Chineke.

Isi ihe mere o ji bịa Ọ dị mgbe Jizọs kwuru, sị: “Aghaghịkwa m izisara obodo ndị ọzọ ozi ọma alaeze Chineke, n’ihi na ọ bụ nke a mere e ji zite m.” (Luk 4:43) Ọ bụ ezie na o meere ndị nọ ná mkpa ọtụtụ ihe ọma, isi ihe o ji ndụ ya mee bụ ikwusa Alaeze Chineke. Anyị ga-atụle ihe ndị ọ kụziri banyere Alaeze ahụ ma e mechaa.

O doro anya na Jizọs bụ mmadụ pụrụ iche.a Anyị ga-emecha hụ na ndụ o biri n’eluigwe mere ka okwu ndị o kwuru n’ụwa bakwuo uru. Ọ̀ bụ ihe ijuanya na o kwusara ozi ga-emetụta ndụ ọtụtụ nde mmadụ gburugburu ụwa?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere Jizọs na ọrụ ọ na-arụ n’imezu nzube Chineke, gụọ isi 4 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya