Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w10 9/1 p. 30-31
  • Chineke Anaghị Ele Mmadụ Anya n’Ihu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Chineke Anaghị Ele Mmadụ Anya n’Ihu
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mbibi E Bibiri Sọdọm na Gọmọra
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Jizọs Gwọrọ Ndị Mmadụ Ọrịa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Amamihe Jizọs Tụrụ Ndị Gere Ya Ntị n’Anya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Jizọs Meriri Ọnwụnwa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
w10 9/1 p. 30-31

Maka Ndị Na-eto Eto

Chineke Anaghị Ele Mmadụ Anya n’Ihu

Otú ị ga-esi mee ya: Nọrọ n’ebe ụzụ na-adịghị mee ihe omume a. Mgbe ị na-agụ amaokwu ndị a, were ya na ị nọ mgbe ihe ahụ ị na-agụ mere. Jiri uche gị kirie ebe ọ na-eme. Nụrụ ihe ndị nọ n’ebe ahụ na-ekwu. Gbalịa ka ị ghọta otú obi dị ndị ị na-agụ akụkọ ha. Ka ihe ị na-agụ yie gị ka ọ̀ na-eme eme ugbu a.

Ndị bụ́ isi n’akụkọ a: Kọnịliọs, Pita

Nchịkọta: Pita ṅomiri Chineke bụ́ onye na-anaghị ele mmadụ anya n’ihu site n’ikwusara Kọnịliọs, bụ́ onye Jentaịl, ozi ọma.

1 CHEBARA OTÚ IHE A SI MEE ECHICHE.—GỤỌ ỌRỤ 10:1-35, 44-48.

Kọwaa otú i chere Kọnịliọs dị.

․․․․․

Olee otú i chere obi dị Kọnịliọs mgbe ya na mmụọ ozi ahụ na-ekwurịta okwu, dị ka e dere ya n’amaokwu nke 3 ruo 6?

․․․․․

Olee ihe i chere Kọnịliọs na ndị na-ejere ya ozi kwurịtara, dị ka amaokwu nke 7 na 8 gosiri?

․․․․․

2 LEBAKWUO YA ANYA.

Olee ihe mere ihe atụ ahụ e nyere Pita n’amaokwu nke 10 ruo 16 ji dị irè? (Ihe ga-enyere gị aka: Cheta na Pita bụ onye Juu, dị ka amaokwu nke 14 gosiri.)

․․․․․

Olee àgwà ị hụrụ Kọnịliọs nwere site n’ihe dị n’amaokwu nke 25? Olee ihe mere o nwere ike iji sie ike inweta onye nọ n’ụdị ọkwá ya nke nwere ụdị àgwà ahụ? (Ihe ga-enyere gị aka: Gụọ amaokwu 1.)

․․․․․

Jiri ihe ndị e ji eme nnyocha i nwere chọpụta mmadụ ole nọ n’òtù ndị agha Ịtali, bụ́ ndị nọ n’okpuru Kọnịliọs.

․․․․․

Olee ihe mere nchegharị Kọnịliọs ji pụọ iche?

․․․․․

3 MEE IHE Ị MỤTARA. DEE IHE Ị MỤTARA BANYERE . . .

Iji ihe atụ ezi ihe otú ọ ga-eru ndị mmadụ n’obi.

․․․․․

Otú o si bụrụ na Chineke anaghị ele mmadụ anya n’ihu.

․․․․․

Otú i nwere ike isi gosi na ị naghị ele mmadụ anya n’ihu.

․․․․․

4 OLEE IHE KACHA BAARA GỊ URU N’AKỤKỌ A? Ọ̀ BỤ MAKA GỊNỊ?

․․․․․

Ọ BỤRỤ NA I NWEGHỊ BAỊBỤL, GWA NDỊÀMÀ JEHOVA KA HA NYE GỊ OTU, MA Ọ BỤ GỊ AMATAKWUO BANYERE YA NA www.watchtower.org na www.jw.org

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya