Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w12 4/1 p. 16-17
  • Gịnị Mere E Ji Eme Ndị Kraịst Baptizim?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Mere E Ji Eme Ndị Kraịst Baptizim?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ime Baptizim Ga-abara Gị Ezigbo Uru
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Ị̀ Dịla Njikere Ime Baptizim?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2020
  • Ihe Baptizim Gị Pụtara
    Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe
  • E Kwesịrị Ime Ndị Kraịst Baptizim
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
w12 4/1 p. 16-17

Mụta Ihe N’okwu Chineke

Gịnị Mere E Ji Eme Ndị Kraịst Baptizim?

N’isiokwu a, a jụrụ ajụjụ ndị o nwere ike ịbụ na ị jụọla. E dekwara ebe ndị i nwere ike ịgụ na Baịbụl gị ka ị hụ azịza ha. Obi ga-adị Ndịàmà Jehova ụtọ ịkọwara gị azịza ha.

1. Gịnị bụ baptizim?

Baptizim bụ ihe Onye Kraịst na-eme iji gwa Chineke na ya chọrọ ka ya na ya dịwa ná mma. N’ihi ya, e kwesịghị ime Onye Kraịst baptizim mgbe ọ bụ nwa ọhụrụ, kama o kwesịrị ịbụ mgbe o torola ma nwee ike ịmụta banyere Chineke na ịghọ onye na-eso ụzọ Jizọs. (Ọrụ 8:12; 1 Pita 3:21) Mmadụ na-aghọ onye na-eso ụzọ Jizọs mgbe ọ mụtara ihe ndị Jizọs nyere n’iwu ma na-eme ha.—Gụọ Matiu 28:19, 20.

N’oge ndịozi Jizọs nọ n’ụwa, ọtụtụ ndị ha ziri ozi ọma ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs ozugbo n’ihi ihe ndị ha mụtara banyere Chineke na Jizọs. Dị ka ihe atụ, mgbe otu nwoke mụtara na ọnwụ Jizọs ga-eme ka mmadụ nweta nzọpụta, ọ ghọrọ onye na-eso ụzọ Jizọs ozugbo. Taakwa, ọtụtụ ndị nwere ezi obi aghọọla ndị na-eso ụzọ Jizọs.—Gụọ Ọrụ 8:26-31, 35-38.

2. Gịnị mere e ji mee Jizọs baptizim?

Jizọs dị ihe dị ka afọ iri atọ mgbe Jọn Onye Na-eme Baptizim mere ya baptizim n’Osimiri Jọdan. Baptizim Jizọs mere gosiri na Jizọs ekpebiela ime uche Chineke, ya bụ, ime ihe ndị Chineke chọrọ ka o mee. (Ndị Hibru 10:7) Otu n’ime ihe ndị ahụ bụ iji ndụ ya chụọ àjà maka mmehie ụmụ mmadụ. Jizọs hụrụ Nna ya, bụ́ Jehova, n’anya ma na-erubere ya isi tupudị ya esi n’eluigwe bịa n’ụwa.—Gụọ Mak 1:9-11; Jọn 8:29; 17:5.

3. Gịnị mere e ji kwesị ime Ndị Kraịst baptizim?

Anyị na Jizọs abụghị otu n’ihi na a mụrụ anyị ná mmehie. Ma àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ maka anyị emeela ka anyị na Chineke nwee ike ịdị ná mma. (Ndị Rom 5:10, 12; 12:1, 2) Ugbu a, Chineke nwere ike ịbụrụ anyị nna, anyịnwa abụrụkwa ụmụ ya. (2 Ndị Kọrịnt 6:18) Gịnị ka anyị ga-eme ka anyị nwee ike ịghọ ụmụ ya? Ihe mmadụ ga-eme bụ naanị ya ịnọ kpee ekpere, gwa Jehova na ya na-enyefe ya onwe ya, kwekwa ya nkwa na ya ga-eji ndụ ya niile jeere ya ozi. Mgbe mmadụ mechara nke a, a na-emezi onye ahụ baptizim. Baptizim ahụ a ga-eme ya ga-egosi ndị mmadụ na onye ahụ enyefeela Chineke onwe ya.—Gụọ Matiu 16:24; 1 Pita 4:2.

4. Olee ihe ndị ị ga-eme tupu e mee gị baptizim?

Ọ bụrụ na mmadụ chọrọ ịmatakwu Chineke, Ndịàmà Jehova na-amụrụ onye ahụ Baịbụl. Mgbe mmadụ na-amụ Baịbụl ma na-abịa ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova, okwukwe onye ahụ ga-esikwu ike, ọ ga-amalitekwa ịhụkwu Chineke n’anya. Ịmụ Baịbụl na ịga ọmụmụ ihe ga-enyekwara onye ahụ aka ịmụta àgwà ọma na ime ihe dị mma. Ọ bụrụ na mmadụ amalite ịhụ Chineke n’anya, nwekwuo okwukwe, ma na-eme omume ọma, onye ahụ ga-enwe ike imezu nkwa ahụ o kwere Jehova nke bụ́ ife ya ruo mgbe ebighị ebi.—Gụọ Jọn 17:3; Ndị Hibru 10:24, 25.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere ihe ndị a kọrọ n’isiokwu a, gụọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? isi nke 18 n’akwụkwọ a Ndịàmà Jehova bipụtara.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya