Ị̀ Maara?
Olee ebe e si nweta nkume ndị a kwụnyere n’akpa obi nke nnukwu onye nchụàjà n’Izrel na-eyi?
▪ Mgbe ndị Izrel hapụrụ Ijipt ma banye n’ala ịkpa, Chineke nyere ha iwu ka ha mee akpa obi nke nnukwu onye nchụàjà ga na-eyi. (Ọpụpụ 28:15-21) A kwụnyere nkume dị iche iche n’elu akpa obi ahụ. Nkume ndị ahụ bụ nkume rubi, topaz, emerad, tọkwọiz, safaya, jaspa, leshem, aget, ametist, krisolaịt, ọniks, na jed.a Ndị Izrel hà nwere nkume ndị ahụ dị oké ọnụ ahịa n’eziokwu?
N’oge Baịbụl, e ji nkume ndị ahụ kpọrọ ihe, a na-erekwa ha ere. Dị ka ihe atụ, ndị Ijipt oge ochie na-aga n’obodo ndị dị ezigbo anya enweta nkume ndị ahụ. Ha na-agarucha ebe ndị a na-akpọ Ịran, Afganịstan, na India ugbu a. Ndị Ijipt na-egwupụta ụdị nkume dị iche iche dị oké ọnụ ahịa n’ebe ndị ha na-egwu nkume. Ọ bụ ndị eze Ijipt nwe ihe niile a na-egwute n’ala bụ́ ndị a na-egwupụta n’obodo ndị ha na-achị. Na Baịbụl, Job kwuru na ndị dịrị ndụ n’oge ya na-eji okporo ígwè gaa na-achọ akụ̀ ndị dị n’ime ala, kwuokwa na ha na-esoro ọwara e gwuru n’ime ala gaa na-achọ ihe ndị ahụ. A bịa n’ihe ndị a na-egwupụta n’ala n’oge ahụ, Job kpọrọ nkume safaya na topaz aha.—Job 28:1-11, 19.
Akwụkwọ Ọpụpụ kwuru na mgbe ndị Izrel na-ahapụ Ijipt, ha gara rịọta ndị Ijipt ihe ndị dị oké ọnụ ahịa ha nwere ma “gbawa ndị Ijipt aka.” (Ọpụpụ 12:35, 36) N’ihi ya, ọ ga-abụ n’Ijipt ka ndị Izrel si nweta nkume ndị ahụ a kwụnyere n’akpa obi nke nnukwu onye nchụàjà na-eyi.
Gịnị mere e ji eji mmanya agwọ ọrịa n’oge Baịbụl?
▪ N’otu ihe atụ Jizọs mere, ọ kọrọ akụkọ otu nwoke nke ndị ohi kụrụ ọ dị ndụ ọnwụ ka mma. Jizọs kwuru na otu onye Sameria nyeere nwoke ahụ aka ma kechie ọnyá ya, wụkwasịkwa “ha mmanụ na mmanya.” (Luk 10:30-34) Mgbe Pọl onyeozi degakwaara enyi ya Timoti akwụkwọ ozi, ọ sịrị ya: “Aṅụkwala naanị mmiri ọzọ, kama na-aṅụ ntakịrị mmanya n’ihi afọ gị na ọrịa nke ị na-arịakarị.” (1 Timoti 5:23) Mmanya ahụ Jizọs kwuru na a wụrụ n’ọnyá nwoke ahụ na mmanya Pọl gwara Timoti ka ọ na-aṅụ ọ̀ na-egosi na e ji mmanya agwọ ọrịa n’eziokwu?
Otu akwụkwọ aha ya bụ Ancient Wine kwuru na a na-eji mmanya “egbu ụmụ nje dị iche iche, jirikwa ya agwọ ahụ́ mgbu, na ọrịa ndị ọzọ.” N’oge ochie, mmanya so n’ihe ndị Ijipt, ndị Mesopotemia, na ndị Siria na-ejikarị agwọ ọrịa. Otu akwụkwọ ọkọwa okwu kwuru na mmanya bụ “ọgwụ mbụ e dere n’akwụkwọ nke ndị oge ochie ji agwọ ọrịa.” O nwere otu akwụkwọ nke kwuru banyere ihe ahụ Pọl gwara Timoti. Akwụkwọ ahụ sịrị: “A chọpụtala na nje ndị na-akpata oké ahụ́ ọkụ na nje ndị ọzọ na-anwụ ozugbo e tinyere ha n’ime mmanya.” Ihe ndị a chọpụtara na nso nso a gosiri na e nwere ihe karịrị narị ụmụ irighiri ihe ise ndị na-adị ná mmanya. Ụmụ irighiri ihe ndị ahụ na-enyekwa aka n’ịgwọ ọrịa.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a O siri ike ịmata ihe a na-akpọ nkume niile ahụ n’oge anyị a.
[Foto dị na peeji nke 26]
Ebe ndị ọrụ ugbo na-azọcha mkpụrụ vaịn. e sere ihe a n’ili otu nwoke aha ya bụ Nakht. Ili a dị n’obodo Tibs, n’Ijipt
[Ebe E Si Nweta Foto]
Gianni Dagli Orti/The Art Archive at Art Resource, NY