Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w13 1/1 p. 10-11
  • BAỊBỤL NA-AGBANWE NDỤ NDỊ MMADỤ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • BAỊBỤL NA-AGBANWE NDỤ NDỊ MMADỤ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • “Anaghịzi M Agbara Tigbuo Zọgbuo Ohu”
    Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
w13 1/1 p. 10-11

BAỊBỤL NA-AGBANWE NDỤ NDỊ MMADỤ

“Emechaala m nwere onwe m”

Akụkọ Brian Hewitt kọrọ

  • A MỤRỤ M N’AFỌ: 1981

  • ABỤ M ONYE: AMERỊKA

  • NDỤ M BIRI: ABỤ M NWA MMEFU

[Foto dị na peeji nke 10]

NDỤ M BIRI NA MBỤ:

A mụrụ m n’otu obodo dị jụụ nke dị n’akụkụ Osimiri Ohayo. Aha ya bụ Maụndsviil. Ọ dị n’ebe ugwu West Vejinia, n’Amerịka. Abụ m nwa nke abụọ n’ime ụmụ anọ nne na nna m mụrụ. Anyị dị ụmụ nwoke atọ na otu nwaanyị. Ebe niile na-akpọtụ akpọtụ n’ụlọ anyị. Mama m na papa m na-arụsị ọrụ ike, ha na-akwụwakwa aka ọtọ. Ha hụkwara ndị ọzọ n’anya. Ezinụlọ anyị abaghị ọgaranya, ma anyị na-enweta ihe na-ezuru anyị. Ebe ọ bụ na mama m na papa m bụ Ndịàmà Jehova, ha kụziiri anyị Baịbụl mgbe anyị bụ ụmụaka.

Ma mgbe m na-eto okorobịa, obi m pụrụ n’ihe ndị a kụziiri m. M malitere iche na ime ihe Baịbụl kwuru abaghị uru. Echekwara m na naanị ihe ga-eme ka m nwee obi ụtọ bụ ịna-eme ihe ọ bụla masịrị m. Tupu mụ amara ihe na-emenụ, akwụsịla m ịga ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova. Ụmụnne m abụọ sokwa m na-eme otú ọ bụla masịrị ha. Mama anyị na papa anyị mere ihe niile ha nwere ike ime ka ha nyere anyị aka, ma o nweghị isi.

Amaghị m na otú ahụ m si chọọ ịna-eme ihe ọ bụla masịrị m ga-etinye m ná nsogbu. Otu ụbọchị m si ụlọ akwụkwọ na-alọta, otu enyi m nwoke nyere m sịga ka m ṅụọ, m naara ya sịga ahụ ṅụọ. Malitezie ụbọchị ahụ gawa, m malitere ịkpa àgwà ọjọọ ndị ọzọ. Ọ dịghị anya, mụ amalite ịṅụ ọgwụ ọjọọ na ịṅụbiga mmanya ókè. M malitekwara ibi ndụ rụrụ arụ. Eji m nwayọọ nwayọọ malite ịṅụ ọgwụ ọjọọ ndị ka ndị nke ahụ m na-aṅụbu njọ. Aṅụkwara m ọgwụ ndị a ọtụtụ afọ. Ọgwụ ọjọọ ndị ahụ m na-aṅụ bịaziri rie m ahụ́. Mgbe ọgwụ ọjọọ ahụ m na-aṅụ rikwuru m ahụ́, m maliteziri ire ya ere ka m nwee ike ịna-enweta ego m ga-eji na-ebi ndụ ọjọọ m na-ebi.

Ọ bụ eziokwu na anaghị m ege akọnuche m ntị, akọnuche m na-agwa m mgbe niile na ndụ rụrụ arụ m na-ebi adịghị mma. Ma, echere m na ebe ọ bụ na ọgwụ ọjọọ eriela m ahụ́, ọ dịghị ihe ga-eme ka m hapụ ya. N’agbanyeghị na mụ na ọtụtụ ndị na-anọ ma n’ebe a na-eme oriri ma n’ebe a na-agba egwú disko, owu na-amakarị m, obi anaghịkwa adị m mma. Mgbe ụfọdụ, m cheta na nne na nna m bụ ezigbo mmadụ, ya ana-eju m anya otú m si kpafuo.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M:

N’agbanyeghị na m chere na enwekwaghị m mmekwata, ma ndị ọzọ echeghị otú ahụ. N’afọ 2000, mama m na papa m gwara m ka m soro ha gaa mgbakọ distrikti nke Ndịàmà Jehova. M sokwa ha gaa, ka a sịkwa na mụ agaala. O juru m anya na ụmụnne m abụọ ahụ so m kpafuo bịakwara mgbakọ ahụ.

Mgbe anyị nọ ná mgbakọ ahụ, m bịara cheta na mụ abịabuola ebe ahụ gbaa egwú disko ihe dị ka otu afọ tupu anyị abịa mgbakọ ahụ. Ihe m hụrụ mgbe anyị bịara mgbakọ ahụ metụrụ m n’obi. Mgbe anyị nọ n’ebe ahụ gbaa egwú disko, a tụsasịrị ihe ndị ruru unyi n’ebe niile. Ebe niile na-esikwa sịga sịga. Ihu anaghịkwa atọ ọtụtụ ndị bịara ebe ahụ ọchị. Egwú a kụkwara ebe ahụ na-eme ka obi na-ajọ mmadụ njọ. Ma, ná mgbakọ ahụ anyị gara, ndị bịara ya nwere ezigbo obi ụtọ, ha jikwa obi ụtọ nabata m, ọ bụ eziokwu na ọ dịla anya mụ na ha hụsọrọ. Ha debere ebe niile ahụ ọcha. Ihe a kụzikwara ná mgbakọ ahụ na-eme ka mmadụ nwee olileanya na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu. Mgbe m hụrụ otú ihe ndị ha na-amụta na Baịbụl si na-abara ha uru, m jụwara onwe m ihe mere m ji hapụ ihe Baịbụl kwuru ga na-eme ihe ọzọ!—Aịzaya 48:17, 18.

“Ihe ndị m mụtara na Baịbụl emeela ka m kwụsị ịṅụ ọgwụ ọjọọ, meekwa ka m kwụsị ire ya ere. O meekwala ka m bụrụ ezigbo mmadụ”

Ozugbo anyị lọtara mgbakọ ahụ, ekpebiri m na m ga-ebidokwa ịga ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova. Ụmụnne m abụọ ndị ahụ kpebikwara ịlọghachi n’ihi ihe ndị ha hụrụ na ihe ndị ha nụrụ ná mgbakọ ahụ. Anyị atọ kwetara ka a mụwara anyị Baịbụl.

Ihe kacha metụ m n’obi bụ ihe Jems 4:8 kwuru. Ọ sịrị: “Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.” M chọpụtara na ọ bụrụ na m chọrọ ịbịaru Chineke nso, m ga-akwụsị ihe ọjọọ ndị m na-eme. Ụfọdụ n’ime ihe ọjọọ ndị m kwesịrị ịkwụsị bụ ịṅụ sịga, ịṅụ ọgwụ ọjọọ na ịṅụbiga mmanya ókè.—2 Ndị Kọrịnt 7:1.

Mụ na ndị enyi m mbụ kwụsịrị ịkpa. M nwetakwara ndị enyi ọhụrụ, bụ́ ndị na-efe Jehova. Otu nwoke mụụrụ m Baịbụl nyeere m ezigbo aka. Nwoke a bụ okenye n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova. Ọ na-akpọkarị m na fon, na-abịakwa n’ụlọ m ka ọ mara otú m mere. Ruo taa, mụ na ya ka bụ ezigbo enyi.

Ná mmalite afọ 2001, mụ na ụmụnne m abụọ ndị ahụ nyefere Chineke onwe anyị, e meekwa anyị baptizim. Obi tọrọ mama m na papa m na nwanne m nwoke m tọrọ, nke na-esoghị anyị kpafuo, ezigbo ụtọ na anyị niile na-efezi Jehova.

[Foto dị na peeji nke 10]

URU NDỊ M RITERELA:

M na-echebu na ime ihe Baịbụl kwuru anaghị ekwe mmadụ megharịa ahụ́. Ma ugbu a, achọpụtala m na ime ihe Baịbụl kwuru na-abara mmadụ ezigbo uru, ọ na-emekwa ka mmadụ ghara ịba ná nsogbu. Ihe ndị m mụtara na Baịbụl emeela ka m kwụsị ịṅụ ọgwụ ọjọọ, meekwa ka m kwụsị ire ya ere. O meekwala ka m bụrụ ezigbo mmadụ.

[Foto dị na peeji nke 11]

Obi dị m ụtọ na m so ná ndị na-efe Jehova n’ụwa niile. Ha hụrụ ibe ha n’anya n’eziokwu, ha na-efekọ Chineke ọnụ ma dịrị n’otu. (Jọn 13:34, 35) Alụrụ m otu Onyeàmà Jehova aha ya bụ Adrianne. Chineke ji ya gọzie m. Ahụkwara m ya n’anya nke ukwuu. Anyị na-enwe obi ụtọ n’ihi na mụ na ya na-efekọ Chineke ọnụ.

Kama ịgbawa mbọ ka m nweta ihe ga-abara naanị m uru, m na-ekwusa ozi ọma oge niile ugbu a, na-akụziri ndị mmadụ otú ime ihe Baịbụl kwuru ga-esi baakwara ha uru. Obi ụtọ m na-enweta n’ọrụ a karịrị obi ụtọ m nwetụrụla. Obi siri m ike ikwu na Baịbụl agbanweela ndụ m. Emechaala m nwere onwe m.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya