Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w13 4/15 p. 32
  • Ị̀ MAARA?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ MAARA?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Unu Ahapụla Ịdị Na-ezukọ Ọnụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Otú Krisendọm Si Ghọọ Akụkụ Ụwa Nke A
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Ikwere n’Amụma Bible Na-echebe Ndụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
w13 4/15 p. 32

Ị̀ MAARA?

Mgbe e bibichara ụlọ nsọ Jeruselem n’afọ 70 Oge Ndị Kraịst, è mechara rụghachi ya?

JIZỌS kwuru na a gaghị ahapụ otu nkume n’elu nkume ibe ya n’ụlọ nsọ Jehova. Ihe ahụ o kwuru mezuru n’afọ 70 Oge Ndị Kraịst mgbe Taịtọs du ndị agha Rom gaa bibie Jeruselem. (Mat. 24:2) Ma, Eze Ukwu Rom aha ya bụ Julian mechara chọọ ịrụghachi ụlọ nsọ ahụ.

Ndị mmadụ na-ekwu na Julian bụ eze Rom ikpeazụ kpeere arụsị. Ọ bụ nwa nwanne Constantine Onye Ukwu. Ndị sị na ha bụ Ndị Kraịst kụziiri ya otú ọ ga-esi bụrụ Onye Kraịst. Ma, mgbe ọ ghọrọ eze ukwu n’afọ 361, o kwuru na ya abụghịzi Onye Kraịst n’ihi arụrụala ndị sị na ha bụ Ndị Kraịst na-arụ. Ọ sịrị na ya bụzi onye ọgọ mmụọ. Ụfọdụ akwụkwọ ndị kọrọ ihe ndị mere eme kpọrọ ya “Onye Si n’Ezi Ofufe Dapụ.”

Julian kpọrọ okpukpe ndị sịrị na ha bụ Ndị Kraịst asị. Otu ihe ọ ga-abụ ya mere o ji kpọ ya asị bụ na mgbe ọ dị afọ isii, ọ hụrụ otú ndị isi chọọchị si gbuo nna ya na ndị ikwu ya. Ndị na-akọ akụkọ gbasara chọọchị kọrọ na Julian gwara ndị Juu ka ha rụghachi ụlọ nsọ ha, ka o gosi na Jizọs bụ onye amụma ụgha.a

O doro anya na Julian chọrọ ịrụghachi ụlọ nsọ ahụ. Ma, o dochaghị ndị na-akọ akụkọ ihe mere eme anya ma ò mechara bido ịrụghachi ya. Ọ bụrụkwa na o bidoro ịrụghachi ya, o doghị ha anya ihe mere na ọ rụchaghị ya. Ma, otu ihe doro anya bụ na e gburu Julian mgbe ọ chịrị ihe na-erughị afọ abụọ, atụmatụ ya niile akụọ afọ n’ala.

[Foto dị na peeji nke 32]

Ihe a ga-abụ otú ụlọ nsọ ahụ dị n’oge Jizọs. Foto dị n’okpuru ya bụ otú ọ dịzi taa

a Jizọs ekwughị na a gaghị arụghachi ụlọ nsọ ahụ, kama, o kwuru na a ga-ebibi ya, bụ́kwanụ ihe mere n’afọ 70 Oge Ndị Kraịst.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya