Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w14 7/1 p. 3
  • Ihe Ọjọọ Juru Ebe Niile

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Ọjọọ Juru Ebe Niile
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Mere Ihe Ọjọọ Ji Eme Ndị Ezigbo Mmadụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • N’Ihi Gịnị Ka Chineke Ji Kwere Ka Ihe Ọjọọ Dịrị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • N’ihi Gịnị Ka Chineke Ji kwere Ka Anyị Na-ata Ahụhụ?
    Teta!—2004
  • Ọ̀ Bụ Chineke Na-akpata Nsogbu Ụwa?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
w14 7/1 p. 3

ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | GỊNỊ MERE IHE ỌJỌỌ JI EME NDỊ EZIGBO MMADỤ?

Ihe Ọjọọ Juru Ebe Niile

Ebe ndị ezinụlọ onye nwụrụ anwụ na-eru uju

E nwere otu nwaanyị dị afọ iri atọ na ise. Aha ya bụ Smita.a O bi n’obodo Daka, nke dị na Bangledesh. Ọhaneze ma na ọ hụrụ ndị mmadụ n’anya, bụrụkwa nwaanyị obiọma. Ha makwa na ọ na-agba mbọ n’ụlọ di ya nakwa na obi na-adị ya ụtọ mgbe niile. Ihe ọzọ e ji mara ya bụ na ọ na-akụziri ndị mmadụ gbasara Chineke. Obi gbawara ndị ezinụlọ Smita na ndị enyi ya mgbe o butere ọrịa na mberede ma nwụọ n’ihe na-erughị otu izu.

E nwere otu nwoke a na-akpọ James. Ya na nwunye ya agafetụla afọ iri atọ. Ọ bụ àgwà ọma ndị ahụ e ji mara Smita ka e jikwa mara ya na nwunye ya. Ma, mgbe di na nwunye a gara ileta ndị enyi ha bi n’ebe dị nso n’Oké Osimiri Pasifik, n’Amerịka, ha alọtakwaghị n’ụlọ ha dị na Niu Yọk. N’oge ahụ ha gara ebe ahụ, ha nwere ihe mberede okporo ụzọ. Ihe mberede ahụ takwara isi ha. Ọnwụ ha wutere ndị hụrụ ha n’anya na ndị ha na ha na-arụkọ ọrụ.

Ebe ọ bụla i lere anya n’ụwa, ị ga-ahụ na ihe ọjọọ na ahụhụ juru eju bara abara. Agha ndị mmadụ na-alụ na-egbu ma ndị gara agha ma ndị na-agaghị agha. Ndị mmadụ na-arụsa ndị ọ na-enweghị ihe ha mere arụrụala, na-emesokwa ha ihe ike. Ọrịa na ihe mberede na-emenyụ ndị mmadụ anya, ma ndị ukwu ma ndị nta, ma ụmụaka ma ndị toro eto. Ọdachị ndị na-emere onwe ha na-egbuchapụ ndị bi n’ebe dị iche iche n’asọghi onye ọ bụla anya. Ịkpọasị na mmegbu juru ebe niile. O nwekwara ike ịbụ na otu n’ime ihe ọjọọ ndị a emetụla gị.

Nsogbu ndị a emeela ka ndị mmadụ na-ajụ, sị:

  • Gịnị mere ihe ọjọọ ji eme ndị ezigbo mmadụ?

  • Ọ̀ bụ Chineke na-akpata ihe ọjọọ ndị ahụ?

  • Ọ̀ bụ ndị mmadụ na-akpata ọdachi ndị na-emenụ, ka hà na-emere onwe ha?

  • Ọ̀ bụ ihe mmadụ metara n’ụwa ya mbụ mere o ji ata ahụhụ?

  • Ọ bụrụ na Chineke onye pụrụ ime ihe niile dị adị, gịnị mere o ji kwe ka ihe ọjọọ na-eme ndị ezigbo mmadụ?

  • Ò nwere mgbe ihe ọjọọ na ahụhụ na-agaghịzi adị n’ụwa?

Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịmata azịza ajụjụ ndị a, anyị ga-ebugodị ụzọ mata azịza ajụjụ abụọ dị mkpa. Nke mbụ bụ: Gịnị mere ihe ọjọọ ji malite ime? Nke abụọ bụ: Gịnị ka Chineke ga-eme ihe ọjọọ ndị na-emenụ?

a Aha a kpọrọ ndị mmadụ n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya