Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w15 9/1 p. 4
  • Olee Ụdị Ndị Ndịàmà Jehova Bụ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Ụdị Ndị Ndịàmà Jehova Bụ?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Mere Anyị Ji Ezi Ndị Mmadụ Ozi Ọma?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Etinyela Aka na Ndọrọ Ndọrọ Ọchịchị n’Ụwa A Na-adịghị n’Otu
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • Ihe Ịdị Iche n’Ụwa Pụtara
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • “Ha Abụghị Akụkụ nke Ụwa”
    Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
w15 9/1 p. 4
Ebe Ndịàmà Jehova sí n’agbụrụ dị iche iche na-ekele ibe ha n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ha

ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | OLE NDỊ BỤ NDỊÀMÀ JEHOVA?

Olee Ụdị Ndị Ndịàmà Jehova Bụ?

Okpukpe anyị zuru ụwa ọnụ. O nweghịkwa okpukpe ọzọ e jikọtara anyị na ya. Ọ bụ eziokwu na isi ụlọ ọrụ anyị dị n’Amerịka, ọtụtụ n’ime anyị bi ná mba ndị ọzọ. Anyị karịrị nde asatọ n’ụwa niile. Anyị na-akụziri ndị mmadụ Baịbụl n’ihe karịrị narị mba abụọ na iri atọ. Ọ bụ Jizọs kwuru ka anyị na-eme ya. Ọ sịrị na “a ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba niile.”—Matiu 24:14.

Anyị na-erubere iwu obodo ọ bụla anyị bi na ya isi. Ma, anyị anaghị eso na ndọrọ ndọrọ ọchịchị n’ihi na Jizọs kwuru na Ndị Kraịst “abụghị nke ụwa.” Ọ bụkwa ya mere na anyị anaghị akwado ihe ọ bụla gbasara ịlụ agha. (Jọn 15:19; 17:16) Mgbe a na-alụ Agha Ụwa nke Abụọ, a tụdịrị ụfọdụ Ndịàmà Jehova mkpọrọ, mekpọọ ụfọdụ ọnụ, gbuokwa ụfọdụ maka na ha ekweghị aga agha. Otu onye bụ́bu bishọp na Jamanị dere, sị: “Ọ bụ naanị ha bụ okpukpe nwere ike ikwu na akọ na uche ha ekweghị ha gaa agha n’oge ndị Nazi na-achị Jamanị.”

“[Ndịàmà Jehova] na-akpa àgwà ọma. Ha anaghị achọ ihe ga-abara naanị ha uru. Ọ bụ ụdị ndị dị ka ha kwesịrị ịnọ n’isi ọchịchị. Ma, i mekataghị hụ aka ha n’ọchịchị. . . . Ha na-erubere ndị ọchịchị isi, ma, ha kweere na ọ bụ naanị Alaeze Chineke ga-eme ka nsogbu ụmụ mmadụ bie.”—Ihe a gbara n’akwụkwọ akụkọ a na-akpọ Nová Svoboda, nke a na-ebipụta na Chek Ripọblik.

Ma, anyị anaghị asọ ndị ọzọ asọ. Jizọs rịọrọ Chineke gbasara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ihe m na-arịọ gị abụghị ka ị kpọpụ ha n’ụwa.” (Jọn 17:15) Ọ bụ ya mere na i nwere ike ịhụ ebe anyị na ndị ọzọ na-arụkọ ọrụ, na-azụkọ ahịa ma ọ bụ na-agakọ akwụkwọ n’obodo anyị dị iche iche.

MBA NDỊ A KACHA NWEE NDỊÀMÀ JEHOVA

  • Amerịka 1,190,000

  • Meksiko 800,000

  • Brazil 770,000

  • Naịjirịa 330,000

  • Ịtali 250,000

  • Japan 220,000

Obodo Izrel n’oge a

Lee vidio Bekee aha ya bụ Special Convention in Israel, nke dị na www.jw.org, ka ị hụ otú Ndịàmà Jehova bụ́ ndị Izrel na ndị nke Palestaịn si na-emekọ ihe ọnụ n’agbanyeghị na mba abụọ a na-ese okwu. (Gaa n’ebe e dere ABOUT US pịa ebe e dere CONVENTIONS)

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya