Isiokwu Ndị Dị́ n’Ụlọ Nche A
IZU NA-AMALITE NA MEE 30, 2016 RUO JUN 5, 2016
3 Ikwesị Ntụkwasị Obi Ga-eme Ka Chineke Gọzie Anyị
N’isiokwu a, anyị ga-amụta ihe nyeere Jefta na ada ya aka ikwesị ntụkwasị obi n’ebe Jehova nọ, ma mgbe ọ na-adịrịghị ha mfe. Anyị ga-ahụ ihe mere o ji bụrụ na ihe ọ bụla anyị mere iji mee Chineke obi ụtọ efughị ọhịa.
IZU NA-AMALITE NA JUN 6 RUO 12, 2016
9 “Ka Ntachi Obi Rụzuo Ọrụ Ya”
Ọ bụrụ na anyị chọrọ inweta ndụ ebighị ebi, anyị ga-atachi obi ruo ọgwụgwụ. N’isiokwu a, anyị ga-atụle ihe anọ ga-enyere anyị aka ịtachi obi nakwa mmadụ atọ tachiri obi nke ọma. A ga-akọwakwa ọrụ ntachi obi kwesịrị ịrụzu n’ebe onye ọ bụla n’ime anyị nọ.
IZU NA-AMALITE NA JUN 13 RUO 19, 2016
15 Gịnị Mere Anyị Ji Kwesị Ịna-ezukọ Maka Ife Chineke?
E nwere ọtụtụ ihe nwere ike ime ka o siere anyị ike ịna-agachi ọmụmụ ihe anya. Isiokwu a ga-agba anyị ume ka anyị na-aga ọmụmụ ihe. Ọ ga-akọwa uru ịga ọmụmụ ihe na-abara anyị na ndị ọzọ nakwa ihe mere o ji eme Jehova obi ụtọ.
IZU NA-AMALITE NA JUN 20 RUO 26, 2016
21 Etinyela Aka na Ndọrọ Ndọrọ Ọchịchị n’Ụwa A Na-adịghị n’Otu
Ọtụtụ ndị ọchịchị taa hapụrụ anyị ka anyị ghara itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ma, ka anyị na-eru ọgwụgwụ ụwa a, anyị ekwesịghị ịtụ anya na ha ka ga-ahapụ anyị otú ahụ. N’isiokwu a, anyị ga-atụle ihe anọ ga-enyere anyị aka ịna-erubere Jehova isi.
27 Akụkọ Ndụ—Otú Ndị Bụ́bu Ndị Sista Si Ghọọ Ezigbo Ụmụnna Nwaanyị