Isiokwu Ndị Dị́ n’Ụlọ Nche A
IZU NA-AMALITE NA JUN 27, 2016 RUO JULAỊ 3, 2016
3 Jiri Ịhụnanya Na-edozi Nghọtahie
N’ihi ezughị okè anyị ketara eketa, anyị na ụmụnna anyị nwere ike inwe nghọtahie mgbe ụfọdụ. N’isiokwu a, anyị ga-amụta ihe Baịbụl kwuru ga-enyere anyị aka idozi nghọtahie ka anyị na ndị ọzọ dịrị n’udo.
IZU NA-AMALITE NA JULAỊ 4 RUO 10, 2016
8 “Gaanụ Mee Ndị Mba Niile Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ M”
Isiokwu a kọwara ihe ndị na-egosi na ọ bụ naanị Ndịàmà Jehova na-emezu amụma ahụ Jizọs buru na Matiu 24:14. Ọ kọwakwara ihe ịbụ “ndị na-akụta mmadụ” pụtara.—Mat. 4:19.
IZU NA-AMALITE NA JULAỊ 11 RUO 17, 2016
Mgbe ị na-ekpebi ihe ị ga-eme, ị̀ na-eme naanị ihe i chere na ọ dị mma, ka ị̀ na-ajụ ndị ọzọ ihe ha chere? Isiokwu a kọwara ihe mere anyị ga-eji mee mkpebi ga-akacha baara anyị uru ma ọ bụrụ na anyị eburu ụzọ chee ihe ga-adị Jehova mma.
IZU NA-AMALITE NA JULAỊ 18 RUO 24, 2016
18 Baịbụl Ọ̀ Ka Na-agbanwe Ndụ Gị?
Ime ka àgwà gị na-aka mma ugbu a ị bụ Onye Kraịst ọ̀ na-esiri gị ike karịa otú o siiri gị ịgbanwe àgwà ndị ka njọ ị na-akpabu tupu e mee gị baptizim? Isiokwu a kọwara ihe nwere ike ịkpata ya nakwa otú Okwu Chineke ga-esi na-enyere anyị aka ịna-amụta àgwà ndị dị́ Chineke mma.
IZU NA-AMALITE NA JULAỊ 25 RUO 31, 2016
23 Na-erite Uru n’Ihe Niile Jehova Na-enye Anyị
Isiokwu a ga-eme ka anyị mata ihe nwere ike ime ka anyị ghara irite uru anyị kwesịrị irite n’ihe niile Jehova ji akụziri anyị ihe. Anyị ga-eleba anya n’ihe anyị ga-eme ka ụdị ihe ahụ ghara ime anyị. Anyị ga-amụtakwa otú anyị ga-esi na-erite uru n’ihe niile Jehova ji akụziri anyị ihe.