Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • wp17 nke 1 p. 4
  • Olee Otú M Ga-esi Malite Ịgụ Baịbụl?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Otú M Ga-esi Malite Ịgụ Baịbụl?
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2017
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Ị Ga-eme Ka Baịbụl Baara Gị Ezigbo Uru
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Tinyesie Mgbalị Ike n’Ịgụ Ihe
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Irite Uru Site n’Ọgụgụ Bible Kwa Ụbọchị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Ihe Mere Ịgụ Ihe Ji Dịrị Ụmụaka Mkpa—Nke 1: Ịgụ Akwụkwọ Ka Ọ̀ Bụ Ile Vidio?
    Ihe Ndị Ga-enyere Ezinụlọ Aka
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2017
wp17 nke 1 p. 4

ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | OLEE IHE Ị GA-EME KA ỊGỤ BAỊBỤL NA-ATỌ GỊ ỤTỌ?

Olee Otú M Ga-esi Malite Ịgụ Baịbụl?

Ebe otu nwaanyị na-ekpe ekpere tupu ya agụwa Baịbụl

Olee ihe ị ga-eme ka ịgụ Baịbụl na-atọ gị ụtọ? Legodị ihe ise nyerela ụfọdụ ndị aka.

Nọrọ n’ebe ahụ́ ga-eru gị ala. Gbalịa nọrọ ebe dị jụụ. Gbaa mbọ ka a ghara inwe ihe ga na-adọpụ gị uche. Ịnọ ebe ị ga na-ahụ ihe ị na-agụ nke ọma, nakwa ebe ezigbo ikuku ga na-ekusa gị ga-eme ka ị na-aghọta ihe ị na-agụ.

Jiri obi ọcha gụọ ya. Ebe ọ bụ Nna anyị bi n’eluigwe nwe Baịbụl, ọ ga-abara gị uru ma i mee ka nwatakịrị chọrọ ịmụta ihe n’aka nne ma ọ bụ nna ya hụrụ ya n’anya. Ọ bụrụ na e nwere ihe na-adịghị mma ị na-eche gbasara Baịbụl, ọ ga-adị mma ka ị hapụ ya ka Chineke nwee ike ịkụziri gị ihe.—Abụ Ọma 25:4.

Kpee ekpere tupu gị agụwa Baịbụl. Ọ bụ uche Chineke ka e dere na Baịbụl. Ọ bụ ya mere anyị ji kwesị ịrịọ ya ka o nyere anyị aka ịghọta ya. Chineke kwuru na ọ ga-enye “ndị na-arịọ ya mmụọ nsọ.” (Luk 11:13) Mmụọ nsọ ga-enyere gị aka ịghọta uche Chineke. Nwayọọ nwayọọ, ọ ga-emekwa ka ị ghọta “ihe ndị miri emi nke Chineke.”—1 Ndị Kọrịnt 2:10.

Gụọ ya otú ị ga-aghọta ya. Agụla ya naanị ka ị gụchaa isi ole i kpebiri ịgụ otu mgbe. Chebara ihe ị na-agụ echiche. I nwere ike ịjụ onwe gị ajụjụ ndị dị ka: ‘Olee àgwà ọma onye a na-ekwu gbasara ya ebe a nwere? Olee otú m ga-esi na-eme ka ya?’

Nwee ihe i bu n’obi Baịbụl ị na-achọ ịgụ ga-enyere gị aka na ya. Ị chọọ ka Baịbụl ị na-achọ ịgụ na-atọ gị ụtọ, i kwesịrị ibu n’obi na ị ga-amụta ihe ga-abara gị ezigbo uru. I nwere ike ibu n’obi ịmụtakwu gbasara Chineke, ma ọ bụkwanụ otú ị ga-esi bụrụ ezigbo mmadụ, ezigbo di ma ọ bụ ezigbo nwunye. Gazie ebe Baịbụl kwuru ihe ndị ga-enyere gị aka ime ihe ndị a ị chọrọ ime, gụwa ha.a

Ime ihe ise a ga-eme ka ịgụ Baịbụl na-atọ gị ụtọ. Ma, olee otú ị ga-esi eme ka ọ na-atọkwu gị ụtọ? Isiokwu na-eso nke a ga-akọrọ gị ihe ụfọdụ ị ga-eme.

a Ọ bụrụ na ị maghị ebe e kwuru ihe ndị ahụ na Baịbụl, i nwere ike ịgwa Ndịàmà Jehova ka ha nyere gị aka.

OTÚ Ị GA-ESI NA-AGỤ BAỊBỤL YA ANA-ATỌ GỊ ỤTỌ

  • Agụla ya ọkụ ọkụ

  • Mee ka obi gị dịrị n’ihe ị na-agụ, na-ewere ya ka ị̀ nọ mgbe ihe ndị ahụ na-eme

  • Lee ma ị̀ ga-ahụ otú amaokwu ndị ị na-agụ si gbasa ihe amaokwu ndị ọzọ na-ekwu

  • Chọpụta ihe ebe ị gụrụ na-akụziri gị

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya