Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • wp17 nke 1 p. 6-7
  • Olee Otú Baịbụl Nwere Ike Isi Nyere M Aka ná Ndụ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Otú Baịbụl Nwere Ike Isi Nyere M Aka ná Ndụ?
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2017
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Ga-enyekwuru Ezinụlọ Aka
    Teta!—2018
  • Olee Otú Anyị Ga-esi Amata Azịza Ajụjụ Ndị Na-echu Anyị Ụra?
    Olee Otú Anyị Ga-esi Amata Azịza Ajụjụ Ndị Na-echu Anyị Ụra?
  • Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịghọta Ihe Baịbụl Na-ekwu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Olee Otú Baịbụl Ga-esi Nyere Gị Aka?
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2017
wp17 nke 1 p. 6-7
Ebe otu di na nwunye na-esi nri

ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | OLEE IHE Ị GA-EME KA ỊGỤ BAỊBỤL NA-ATỌ GỊ ỤTỌ?

Olee Otú Baịbụl Nwere Ike Isi Nyere M Aka ná Ndụ?

Baịbụl bụ akwụkwọ pụrụ iche. Ihe e dere na ya bụ ihe Onye kere anyị kwuru ga-abara anyị uru. (2 Timoti 3:16) Ihe ndị o kwuru nwere ike inyere anyị ezigbo aka. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji kwuo, sị: “Okwu Chineke dị ndụ ma na-akpa ike.” (Ndị Hibru 4:12) E nwere ụzọ abụọ dị mkpa Baịbụl nwere ike isi nyere anyị aka ná ndụ. Otu bụ na ọ ga-eme ka ndụ anyị ka mma ugbu a. Nke abụọ abụrụ na ọ ga-enyere anyị aka ịmata Chineke na ihe ndị o kwuru ọ ga-emere anyị.—1 Timoti 4:8; Jems 4:8.

Otú ọ ga-esi eme ka ndụ gị ka mma ugbu a. Baịbụl ga-abara gị ezigbo uru. O kwuru ihe ndị ga-enyere gị aka n’ihe ndị a na-esonụ:

  • Otú gị na ndị ezinụlọ gị na ndị ọzọ ga-esi na-adị ná mma.—Ndị Efesọs 4:31, 32; 5:22, 25, 28, 33.

  • Otú ahụ́ ga-esi esi gị ike, na otú ị ga-esi na-enwe obi ụtọ.—Abụ Ọma 37:8; Ilu 17:22.

  • Otú ị ga-esi na-akpa àgwà.—1 Ndị Kọrịnt 6:9, 10.

  • Otú ị ga-esi akpa afọ gị.—Ilu 10:4; 28:19; Ndị Efesọs 4:28.a

E nwere otu di na nwunye bi n’Eshia ihe ha gụtara na Baịbụl baara ezigbo uru. Aha ha bụ Vicent na Annalou. Mgbe ha lụrụ ọhụrụ, o siiri ha ike ịghọta ibe ha, nakwa ịna-agwa ibe ha obi ha, otú ahụ ọ na-adị ọtụtụ ndị lụrụ ọhụrụ. Ma, ha bidoro mewe ihe ha na-agụta na Baịbụl. Olee uru ọ baara ha? Vicent kwuru, sị: “Ihe ndị m gụrụ na Baịbụl enyerela m aka iji obiọma na-edozi nsogbu mụ na nwunye m na-enwe. O nyekwarala anyị aka ịna-ebi n’udo.” Annalou, nwunye ya kwetara ihe a di ya kwuru. Ọ sịrị: “Ịgụ gbasara ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl fere Chineke nyeere anyị aka. Obi na-atọ m ụtọ ugbu a maka otú mụ na di m si biri n’udo, nakwa maka ihe anyị ji ndụ anyị na-eme.”

Ịmata Chineke. Vicent kwukwara uru ọzọ ịgụ Baịbụl baara ya. Ọ sịrị: “Ịgụ Baịbụl emeela ka mụ na Jehova dịrị ná mma ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ.” Ihe a Vicent kwuru na-egosi na Baịbụl na-enyere anyị aka ịmata Chineke nke ọma. Ọ bụrụ na ị mata Chineke nke ọma, ime ihe o kwuru ga na-abara gị uru, gị na ya ga-abụkwa enyi. Ị ga-achọputa na ọ gwara anyị na ọ ga-emere anyị ọtụtụ ihe ọma  n’ọdịnihu. N’oge ahụ, anyị ga-adị ‘ndụ nke bụ́ ndụ n’ezie,’ ya bụ, ndụ ebighị ebi. (1 Timoti 6:19) E nweghị akwụkwọ ọzọ nwere ike ịkọrọ anyị ihe ndị a ma e wezụga Baịbụl.

Ọ bụrụ na i bido gụwa Baịbụl ma nọgide na-agụ ya, ọ ga-eme ka ndụ gị ka mma ugbu a, gị amatakwa Chineke. Ma ka ị na-agụ Baịbụl, i nwere ike inwe ọtụtụ ihe ga-agbagwoju gị anya ị ga-achọ ịjụ ajụjụ gbasara ya. Ọ bụrụ na i nwee ajụjụ, ihe otu nwoke onye Itiopia dịrị ndụ ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga mere nwere ike inyere gị aka. O nwere ọtụtụ ajụjụ gbasara ihe ọ gụtara na Baịbụl. Mgbe otu onye na-eso ụzọ Jizọs aha ya bụ Filip, jụrụ ya ma ọ̀ ma ihe ihe ọ na-agụ pụtara, ọ sịrị: “Olee otú m ga-esi mara, ma ọ bụrụ na mmadụ eduzighị m?”b O kwetaziri ka Filip, bụ́ onye ma Baịbụl nke ọma nyere ya aka ịghọta ihe ọ na-agụ. (Ọrụ Ndịozi 8:30, 31, 34) Ọ bụrụkwa na ị chọrọ ịmụtakwu Baịbụl, gaa na jw.org/ig pịa ebe e dere “Gwa Anyị Ka Anyị na Gị Mụwa Baịbụl,” dejuo fọm dị ebe ahụ. I nwekwara ike iji adres anyị dị n’Ụlọ Nche a detara anyị akwụkwọ ozi. Jiri nke kacha dị nso n’ebe i bi deta ya. I nwekwara ike ịgwa Onyeàmà Jehova ọ bụla ị hụrụ na ị ga-achọ ka a bịa mụwara gị Baịbụl ma ọ bụkwanụ gị agaa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị dị gị nso. Gbalịa bido taa gụwa Baịbụl ka o nyere gị aka ime ka ndụ gị ka mma.

Ọ bụrụ na ị na-enwe obi abụọ ma ihe Baịbụl kwuru ọ̀ bụ eziokwu, biko lee vidio bụ́ Olee Ihe Ndị Gosiri na Baịbụl Na-ekwu Eziokwu? Ị ga-ahụ vidio a ma ị gaa na jw.org/ig, pịa ebe e dere IHE NDỊ ANYỊ NWERE, pịa VIDIO, pịzie BAỊBỤL.

a Ị chọọ ịmatakwu ihe ndị ọzọ Baịbụl kwuru ga-enyere gị aka, gaa na jw.org/ig. Pịa ebe e dere IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI, pịzie AJỤJỤ NDỊ BAỊBỤL ZARA.

b Gụọkwa isiokwu bụ́ “Mmadụ Ịghọtahie Ihe Baịbụl Kwuru, Ọ̀ Bụ Obere Ihe?” Ọ dị n’Ụlọ Nche a.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya