Isiokwu Ndị Dị n’Ụlọ Nche A
IZU NA-AMALITE NA SEPTEMBA 25, 2017 RUO ỌKTOBA 1, 2017
3 Ị̀ Dị Njikere Iji Ndidi Chere Jehova?
IZU NA-AMALITE N’ỌKTOBA 2 RUO 8, 2017
8 “Udo nke Chineke . . . Karịrị Echiche Niile”
Isiokwu nke mbụ ga-akọwa ihe mere anyị ji kwesị ịdị njikere iji ndidi chere Jehova. Ọ ga-akọwakwa ihe ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị ji obi ha niile fee Chineke n’oge ochie mere nke ga-enyere anyị aka iji ndidi chere Jehova. Isiokwu nke abụọ ga-akọwa otú Jehova ga-esi mee ihe anyị na-atụghị anya ya. Anyị jiri ndidi na-echere Jehova, ọ ga-eme ka anyị tụkwasịkwuo ya obi.
13 Akụkọ Ndụ—Ịtachi Obi n’Ọnwụnwa Mere Ka Jehova Gọzie M
IZU NA-AMALITE N’ỌKTOBA 9 RUO 15, 2017
17 Otú Anyị Ga-esi Yipụ Mmadụ Ochie Ahụ, Gharakwa Iyiri Ya Ọzọ
IZU NA-AMALITE N’ỌKTOBA 16 RUO 22, 2017
22 Otú Anyị Ga-esi Yiri Mmadụ Ọhụrụ Ahụ, Gharakwa Iyipụ Ya Ọzọ
Isiokwu nke mbụ ga-akọwa ihe mmadụ iyipụ mmadụ ochie ahụ pụtara na ihe mere anyị ji kwesị iyipụ mmadụ ochie ahụ n’egbughị oge. Ọ ga-akọwakwa ihe anyị ga-eme ka anyị ghara iyiri mmadụ ochie ahụ ọzọ. Isiokwu nke abụọ ga-akọwa àgwà ndị so ná mmadụ ọhụrụ ahụ, kọwaakwa otú anyị ga-esi na-akpa àgwà ndị ahụ ma n’ihe ndị anyị na-eme ma n’ozi ọma.
27 Ịhụnanya Bụ Àgwà Bara Ezigbo Uru