Isiokwu Ndị Dị n’Ụlọ Nche A
IZU NA-AMALITE N’ỌKTOBA 23 RUO 29, 2017
Jehova kacha onye ọ bụla ejide onwe ya. Olee otú anyị ga-esi na-ejide onwe anyị ka ya? Olee ihe ndị ị ga-eme ka ị na-ejidekwu onwe gị?
IZU NA-AMALITE N’ỌKTOBA 30, 2017 RUO NỌVEMBA 5, 2017
Olee ihe inwere mmadụ ọmịiko pụtara? Ma Jehova ma Jizọs na-enwe ọmịiko. Olee ihe ndị anyị ga-eme ka anyị na-eme ka ha? Olee uru ime ka ha ga-abara anyị?
13 Akụkọ Ndụ—Obi Dị M Ụtọ na Mụ na Ụmụnna Hụrụ Jehova n’Anya Rụkọrọ Ọrụ
IZU NA-AMALITE NA NỌVEMBA 6 RUO 12, 2017
18 “Okwu Chineke Anyị Ga-adịgide Ruo Mgbe Ebighị Ebi”
IZU NA-AMALITE NA NỌVEMBA 13 RUO 19, 2017
23 “Okwu Chineke . . . Na-akpa Ike”
Gịnị mere o ji dị mkpa ka a na-asụgharị Baịbụl n’ọtụtụ asụsụ? Olee otú anyị ga-esi gosi na obi dị anyị ụtọ na anyị nwere Okwu Chineke n’asụsụ na-eru anyị n’obi? Isiokwu abụọ a ga-eme ka anyị jiri Baịbụl kpọrọkwuo ihe, meekwa ka anyị hụkwuo Onye e dere uche ya na Baịbụl n’anya.
IZU NA-AMALITE NA NỌVEMBA 20 RUO 26, 2017
28 “Nwee Obi Ike . . . Meekwa Ihe”
Obi ike dị Ndị Kraịst mkpa. Olee ihe ndị anyị nwere ike ịmụta n’aka ndị nwere obi ike n’oge ochie? Olee otú ndị na-eto eto, ndị nne na nna, ụmụnna nwaanyị katarala ahụ́ na ụmụnna nwoke e merela baptizim ga-esi gosi na ha nwere obi ike, nakwa na ha dị njikere ịrụ ezi ọrụ?