Okwu Mmeghe Pụrụ Ime Ka E Nwee Ọdịiche
1 Ị̀ nọwo na-eji ụfọdụ n’ime okwu mmeghe ndị a tụrụ aro ha n’akwụkwọ Ụzọ Isi Malite ma Na-aga n’Ihu ná Nkwurịta Okwu Bible eme ihe ma ọ bụ ndị na-apụta ná mbipụta Ozi Alaeze Anyị ndị na-adịbeghị anya? Ọtụtụ ndị nkwusa na-akọ na ha na-enwe ihe ịga nke ọma ka ukwuu n’ozi ụlọ n’ụlọ ha site n’iji okwu mmeghe ndị a na-eme ihe kpọmkwem otú ahụ e si bie ha. Ndị ọzọ achọpụtawo na site nanị n’itinyekwu ntakịrị oge n’ime nkwadebe maka ozi ubi, ha enwewo ike ichepụta okwu mmeghe n’okwu nke aka ha ma dabere n’ihe e kwuru n’aro ndị ahụ e biri ebi.
2 Otu ihe doro anya, nke ahụ bụkwa na ọ bụrụ na i buru nnọọ okwu mmeghe gị n’obi tupu i jiri ozi Alaeze ahụ jekwuru mmadụ, ị ga-enwe ahụ iru ala na obi ike karị. Ihe ndị ị na-ekwu ga-egosipụta ezi ọchịchọ i nwere isoro ndị ọzọ kerịta ozi ọma ahụ. Ime ezi nkwadebe ga-eme ka ozi gị dị ụtọ karị n’ihi na ị ga-arụpụta ihe ndị ka mma. Ihe kasị mkpa bụ na anyị ga-eme ka àjà ije ozi anyị na-achụ bụrụ nke kasị mma anyị pụrụ ịchụ.—Hib. 13:15; 1 Pita 2:5.
3 Ya mere, wepụta oge iji wee kwadebe. Chee echiche banyere ụdị ndị ị pụrụ izute n’ókèala unu. Gịnị bụ ihe ndị na-echegbu ha? Olee ihe ndị na-eme ugbu a na-emetụta ndụ ha? Mgbe i chesịrị echiche banyere azịza nye ajụjụ ndị a, nyoba anya n’okwu mmeghe ndị a tụrụ aro ha na peeji nke 2-7 n’akwụkwọ bụ́ Ụzọ Isi Malite ma Na-aga n’Ihu ná Nkwurịta Okwu Bible ma ọ bụ họrọ otu okwu mmeghe ma ọ bụ abụọ site n’Ozi Alaeze Anyị. Enwela obi abụọ imegharị ma ọ bụ ịgbanwe ihe ndị e kwuru kpọmkwem ka ahụ wee ruo gị ala iji ya eme ihe. Nzọụkwụ ọzọ ga-abụ ime ka ndị nkwusa ndị ọzọ soro gị tụleghachi okwu mmeghe gị ná nnọkọ mmụgharị ihe. Ikekwe, nke a ga-agbakwa ndị ọzọ ahụ ume imeziwanyekwa okwu mmeghe nke ha. Ka o sina dị, n’ezie, unu ga na-agbarịta ibe unu ume ma na-ewulirịta ibe unu elu n’ọrụ ọma.
4 A ga-akwụghachi gị ụgwọ maka oge na mgbalị ị na-etinye n’ịkwadebe ụzọ iche ihe n’ihu nke gị n’ubi. Ị pụrụ inweta ngọzi nke ikerekwu òkè dị irè n’ọrụ nchịkọbata ahụ na-enye obi ụtọ nke na-aga n’ihu ugbu a.