Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 11/95 p. 7
  • Ịma Ọkwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịma Ọkwa
  • Ozi Alaeze Anyi—1995
Ozi Alaeze Anyi—1995
km 11/95 p. 7

Ịma Ọkwa

◼ Akwụkwọ ndị a ga-enyefe na November: Bekee—New World Translation of the Holy Scriptures na akwụkwọ The Bible—God’s Word or Man’s? n’ụtụ ₦400 (Bible nanị, ₦320). Yoruba—New World Translation of the Christian Greek Scriptures n’ụtụ ₦120. Asụsụ ndị ọzọ—Akwukwọm nke Akukọ Bible n’ụtụ ₦240 ma ọ bụ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala (nke nnukwu, ₦240; nke obere, ₦120). December: Asụsụ nile—Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ. Ọ bụrụ na e nweghị ya, jiri Akwukwọm nke Akukọ Bible ma ọ bụ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala mee ihe. January: Asụsụ nile—A pụrụ inyefe akwụkwọ ọ bụla dị 192 peji e biri n’akwụkwọ na-achanwụ achanwụ ma ọ bụ ndị na-agbanwe ụcha ha ma ọ bụ nke ọ bụla e biri tupu 1982 n’ọnụ ego dị ala. A gaghị agụnye akwụkwọ ndị e ji akwụkwọ ndị na-adịghị achanwụ achanwụ ma ọ bụ ndị na-adịghị agbanwe ụcha ha ná ndị a ga-enyefe n’ọnụ ego dị ala nke a. February: Bekee, Efịk, na Igbo—Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso! Asụsụ ndị ọzọ—Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala. RỊBA AMA: Ọgbakọ ndị ga-achọ ihe ndị a ga-akpọsa e depụtara n’elu kwesịrị itinye ọda ha na Literature Order Form (S-14) ha nke ọnwa ọzọ.

◼ Society nọ ná mkpa nke ndị nsụgharị n’asụsụ ndị na-esonụ: Efịk, Gun, Hausa, Igala, Igbo, Isoko, Tiv, na Yoruba. Onye ahụ aghaghị ịgụwo akwụkwọ ọ dịkarịa ala afọ 12, nwee akara mmụta credit n’asụsụ Bekee n’ule ordinary level nke GCE ma ọ bụ WASC/SSCE na credit na n’asụsụ nke aka ya ma ọ bụrụ na o lere ule ahụ na GCE ma ọ bụ WASC/SSCE (nke ikpeazụ abụghị iwu). Onye ọ bụla chere na ya pụrụ iru eru, nke nwekwara mmasị n’ije ozi Betel kwesịrị idetara Society akwụkwọ, na-ekwu ka e zitere ya fọm ndejupụta maka Betel. Akwụkwọ ozi ahụ kwesịrị ịgụnye ihe ọmụma banyere ebe ọ gụruru akwụkwọ na asụsụ o chere na ya ruru eru na ya dị ka onye nsụgharị. Ọ ga-adịkwa mma ka onye ahụ zitere anyị rịzọlt ule ma ọ bụ asambodo ya. Ọ bụrụ na o nwere karịa GCE ma ọ bụ WASC/SSCE, ọ pụrụ nanị izite ibe asambodo nke ebe ọ gụruru akwụkwọ ugbu a. Ndị na-etinye akwụkwọ kwesịrị ịbụ ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụ ndị lụrụ di ma ọ bụ nwunye na-enweghị ụmụ, ha kwesịkwara inwere onwe ha ịnakwere ọkpụkpọ òkù ịbịa Betel.

◼ Malite n’izu December 11, a ga-amụ akwụkwọ Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso! n’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ nile.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya