Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 4/96 p. 7
  • Ịma Ọkwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịma Ọkwa
  • Ozi Alaeze Anyi—1996
Ozi Alaeze Anyi—1996
km 4/96 p. 7

Ịma Ọkwa

◼ Akwụkwọ ndị a ga-enyefe n’April na May: Asụsụ nile—Ụtụ Ụlọ Nche. Magazin ndị a na-ebipụta ugboro abụọ n’ọnwa maka otu afọ, ₦400. Otu afọ maka ndị a na-ebipụta otu ugboro n’ọnwa ma ọ bụ ọnwa isii maka ndị a na-ebipụta ugboro abụọ n’ọnwa, ₦200. Maka ókèala a na-arụzu mgbe mgbe, a pụkwara iji broshuọ ọ bụla (e wezụga broshuọ Education na School) mee ihe. June: Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. Ọ bụrụ na nke ahụ adịghị ya, jiri Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ ma ọ bụ akwụkwọ ọ bụla dị 192 peji mee ihe. July na August: A pụrụ iji nke ọ bụla n’ime broshuọ ndị na-esonụ dị 32 peji mee ihe: Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?, Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ?—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya? Idi Ndụ n’Elu Ala Rue Mgbe Ebighị-ebi!, Ì Kwesịrị Ikwere n’Atọ n’Ime Otu?, “Lee! Ana M Eme Ihe Nile Ka Ha Dị Ọhụrụ,” Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ, na Ọchịchị Ahụ Nke Ga-eweta Paradaịs. N’ebe o kwesịrị ekwesị, a pụrụ inyefe broshuọ dị ka Mmụọ nke Ndị Nwụrụ Anwụ—Hà Pụrụ Inyere Gị Aka ka ọ̀ bụ Imerụ Gị Ahụ? Hà Dị Adị n’Ezie? RỊBA AMA: Ọgbakọ ndị ga-achọ ihe ndị a ga-akpọsa e depụtara n’elu kwesịrị itinye ọda ha na Literature Order Form (S-14) ha nke ọnwa ọzọ.

◼ N’ebe o kwere omume, ndị okenye kwesịrị ime ndokwa ka ọgbakọ tinyekwuo oge n’ịgba àmà uhuruchi.

◼ A na-eme mgbanwe n’usoro e ji edochi kaadị Pioneer Service Identification. Site n’ugbu a gaa n’ihu, Society ga na-edochi kaadị maka ndị ọsụ ụzọ kwagharịrị, gbanwee aha ha, tụfuo kaadị ha, ma ọ bụ chọọ ka a gbanweere ha ọrụ. E kwesịrị ịdọkasị kaadị ọ bụla a na-edebeghị ihe ndị odeakwụkwọ pụrụ inwe na faịlụ. A ga na-ahụ maka mgbanwe aha na ọrụ n’ụzọ a na-emebu, odeakwụkwọ ga na-edepụta ihe ọmụma dị mkpa n’azụ Congregation Report (S-1) maka ọnwa ahụ. Nke ahụ gasịa, Society ga-ezigara ọgbakọ kaadị ndị ọhụrụ maka ndị ọsụ ụzọ ahụ. Ndị a ga na-esokarị ndekọ ngụkọ ego kwa ọnwa. E kwesịrị izitere Society mgbanwe ọ bụla ngwa ngwa ka e wee na-ahụ na faịlụ anyị ziri ezi ma nwezuo ihe ọhụrụ. Ọzọ, mgbe onye ọsụ ụzọ kwụsịrị ozi dị otú ahụ, ma ọ bụ e wepụ aha ya, e kwesịrị idejupụta otu fọm S-206 ma zitere Society n’egbughị oge.

◼ N’ụbọchị Saturday nke April 27 na May 25, a ga-emechi ogige Betel. Ya mere, biko abịala maka njem nleta ma ọ bụ iburu akwụkwọ n’ụbọchị ndị a.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya