Ntụleghachi Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
Ntụleghachi e mechiri akwụkwọ na-eme n’ihe omume ndị e mere n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu nile nke May 6 ruo August 19, 1996. Jiri mpempe akwụkwọ ọzọ detuo azịza nye ọnụ ọgụgụ ajụjụ ole i nwere ike n’oge e nyere.
[Rịba ama: N’oge ntụleghachi odide ahụ, nanị Bible ka a pụrụ iji mee ihe n’ịza ajụjụ ọ bụla. Ntụaka ndị na-eso ajụjụ ndị ahụ bụ maka iji mee nnyocha onwe onye gị. Nọmba peji na paragraf nwere ike ha agaghị apụta n’izo aka nile gaa n’Ụlọ Nche.]
Zaa Eziokwu ma ọ bụ Ụgha banyere nke ọ bụla n’okwu ndị na-esonụ:
1. Otu àjà Jisọs chụrụ nọchiri anya àjà nile a chụrụ n’okpuru Iwu Mosis. [uw p. 33 para. 8(4)]
2. ‘Gọg nke Megọg’ bụ nhota ihe atụ nke gọọmenti ụwa a. (Ezik. 38:2) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w 8/15/91 p. 27 para. 2.]
3. Dị nnọọ ka Ohola bụ nwanne nwanyị Oholiba nke okenye, dị ka e sere onyinyo ya n’Ezikiel isi 23, otú ahụ ka okpukpe Roman Katọlik bụ nwanne nwanyị okpukpe Protestant nke okenye, nzukọ abụọ ahụkwa emerụwo onwe ha site n’isoro ike akụ̀ na ụba na nke ọchịchị ụwa na-akwa iko ime mmụọ. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w 4/1/89 p. 30.]
4. N’agbanyeghị ihe anyị mere, ọ bụrụ na anyị ekpegara Chineke ekpere, ihe nile ga-adịcha mma. [uw p. 36 para. 12]
5. A pụrụ ịhụ na ọ dịghị mma inwe ndị na-adịghị erubere iwu Chineke isi dị ka ndị enyi chiri anya site n’ihe mere Daịna, nwa nwanyị Jekọb. [my Akụkọ nke 20]
6. Jemes 4:17 na Ezikiel 33:7-9 kwekọrọ, na-egosi na ọ bụ ihe ọmụma nke ihe Chineke chọrọ n’aka anyị na-eme ka anyị bụrụ ndị ga-aza ajụjụ n’ihu ya. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w 4/1/93 p. 7 para. 1.]
7. Daniel nwapụtara onwe ya ịbụ ezi onye amụma site n’ịkọwa ihe ihe oyiyi ahụ a hụrụ ná nrọ pụtara mgbe Eze Nebukadneza kọwasịrị ya gwa ya. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee Daniel 2:7-9, 26.]
8. Mmiri ahụ nke si n’ụlọ nsọ ahụ a hụrụ n’ọhụụ na-asọpụta nke a kọwara n’Ezikiel 47:1 nọchiri anya ikike ime ka a dị ọcha nke baptism nwere. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w 9/15/88 p. 27 para. 20.]
9. Atụla egwu ịjụ isonyere onye ọ bụla na-agwa gị ka i ‘soro ha gwurie egwu,’ ọ bụrụgodị na ọ bụ onye na-asị na ya bụ onye Kraịst kpọrọ òkù ahụ. (2 Pita 2:18, 19) [uw p. 43 para. 11]
10. A ga-emezu nzube mbụ Chineke maka ihe a kpọrọ mmadụ na ala. (Aịsa. 55:10, 11) [kl p. 9 para. 10]
Zaa ajụjụ ndị na-esonụ:
11. Gịnị ka mgbalị Abraham mere ịchụ Aịsak n’àjà kwesịrị inyere anyị aka ịghọta? (Jen. 22:1-18) [uw p. 32 para. 8(1)]
12. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na ọrụ Jehova Chineke kenyere Adam na Iv bụ iwu? (Jen. 1:28; 2:15) [uw p. 38 para. 2]
13. N’ụzọ dị aṅaa ka Ndịàmà e tere mmanụ nke Jehova na ndị enyi ha na-aghaghị ịdị ka Ezikiel? (Ezik. 11:25) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w 9/15/88 p. 16 para. 3.]
14. Olee ndị mkpụrụ nke Agwọ ahụ na-agụnye? [uw p. 30 para. 3]
15. Tụkwasị n’ibo Jehova ebubo na ọ na-agha ụgha, gịnị ka Setan zọọrọ na Chineke na-egbochi n’ebe ndị o kere eke nọ? (Jen. 3:1-5) [uw p. 46 para. 1]
16. Gịnị bụ “obodo ahụ” e zoro aka na ya ná Ndị Hibru 11:10? [uw p. 48 para. 6]
17. N’ụzọ abụọ dị aṅaa ka a pụrụ ikwu na Adam na Iv nwụrụ ‘n’ụbọchị’ ahụ ha riri site n’osisi ịma ezi ihe na ihe ọjọọ? (Jen. 2:17) [uw p. 56 para. 5]
18. Gịnị ka aha Chineke, bụ́ Jehova pụtara? [kl p. 25 para. 7]
19. Olee onye amụma zoro aka n’ụwa dị ka ihe dị “gburugburu,” oleekwa ebe e dere nke a n’Akwụkwọ Nsọ? [kl p. 17 para. 14]
20. Olee otú Bible si enye anyị echiche doro anya banyere ụkpụrụ Chineke, oleekwa otú anyị pụrụ isi rite uru site n’ihe ọmụma dị otú ahụ? [kl p. 15 para. 9]
Denye okwu ma ọ bụ ahịrị okwu nke dị mkpa iji dejuo nke ọ bụla n’ime okwu ndị na-esonụ:
21. Ná mmezu nke Ezikiel 21:26, e mere ka alaeze “dị elu” nke _________________________ “dị ala” site n’ịbụ nke e bibiri na _________________________ e mekwara ka alaeze “dị ala” nke _________________________ “dị elu,” na-ahapụ ha ka ha chịa ụwa n’enweghị ntinye aka sitere _________________________ ihe atụ nke Chineke. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w 9/15/88 p. 19 para. 16.]
22. N’agbanyeghị na ọ bụ _________________________ e dere tupu o mee, akwụkwọ Daniel bụ eziokwu. A kpọtụrụ Daniel aha ugboro _________________________ n’akwụkwọ Ezikiel. [w 12/1/88 p. 11 para. 5]
23. Mmeso Jehova mesoro Fero kpughere _________________________ ya dị egwu, o kpughekwara _________________________ ya n’inye ajọ ndị mmegide na ndị mkpagbu ahụhụ. [kl p. 27 para. 14]
24. Ọpụpụ 34:7 na-ezo aka n’ihe ga-eme ndị Israel dị ka _________________________ ma ọ bụrụ na ha emehie megide Chineke, e wee dọrọ ha laa n’agha, ebe Ezikiel 18:4 na-ezo aka n’ịza ajụjụ _________________________ n’ebe Chineke nọ. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w 2/1/88 p. 6.]
25. Mgbe ị na-agụ Bible, ọ dị mma ịjụ onwe gị otú ị pụrụ isi tinye ihe ị na-agụ n’ọrụ _________________________ na otú ị pụrụ isi jiri ihe ị na-agụ nyere _________________________ aka. [uw p. 26 para. 12(4) na p. 28 para. 12(5)]
Họrọ azịza ziri ezi na nke ọ bụla n’ime okwu ndị na-esonụ:
26. Nchegbu bụ isi nke onye Kraịst ná ndụ bụ (inwe ihe ùgwù n’ọgbakọ; ịlanarị Amagedọn; inwe mmekọrịta dị mma n’ebe Jehova nọ). [uw p. 42 para. 9]
27. Ọtụtụ ndị na-ajụ ịghọta na nsogbu ndị anyị na-ezute ná ndụ na-abịakarị n’ihi (ndị mmadụ kpebisiworo ike imerụ anyị ahụ; oge na ọnọdụ mberede dị iche iche; agụụ ihe ọjọọ nke aka anyị na mkpakọrịta ọjọọ). (1 Kọr. 15:33; Jes. 1:14, 15) [uw p. 44 para. 13]
28. (Ihe ọmụma; ikike izi ihe; omume) anyị na-egosi ebe anyị guzo n’ihe metụtara ihe iseokwu kasị ukwuu nke na-agụnye iguzosi ike n’ezi ihe anyị nye Chineke. [uw p. 52 para. 12]
29. Ndị mbụ ghọrọ “ihe dịịrị ebere” bụ (ndị Jentaịl; ndị Juu; ndị Sameria e biri úgwù), ndị sochiri ha bụ (ndị Jentaịl; ndị Juu; ndị Sameria e biri úgwù), ndị sochiri n’ikpeazụ bụkwa (ndị Jentaịl; ndị Juu; ndị Sameria e biri úgwù). (Rom 9:23, 24) [uw p. 58 para. 8, 10]
30. (Daniel na Hosea; Joel na Emọs; Aịsaịa na Jeremaịa) buru amụma banyere ọdịda Babilọn. [kl p. 18 para. 17]
Jikọta akụkụ akwụkwọ nsọ ndị a na okwu ndị e depụtara n’okpuru:
Abụ Ọma 78:40, 41; Ezik. 18:25; Dan. 1:8, 11-13; Ọrụ 8:32-38; 1 Jọn 1:8, 9
31. Ekele maka eziokwu ahụ na maka ihe Jisọs Kraịst mere ná mmezu nke amụma Bible na-akwali ndị mmadụ nwere obi eziokwu ịbụ ndị e mere baptism. [uw p. 32 para. 7]
32. Ndị Kraịst na-eto eto ekwesịghị ịla azụ n’iji nkwanye ùgwù mee ka ndị isi na ụmụ akwụkwọ ibe ha mara na ha agaghị emebi akọ na uche ha a zụrụ n’ụzọ Chineke. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w 11/1/92 p. 14 para. 17.]
33. Site n’inwe ezi okwukwe n’àjà Jisọs Kraịst, anyị pụrụ n’ezie inwe akọ na uche dị ọcha n’ihi mgbaghara mmehie. [uw p. 35 para. 10]
34. Ezi ndị Kraịst aghaghị ịdị njikere mgbe nile ịgbanwe echiche ha gaa n’ụzọ Jehova, anyị ekwesịghịkwa iche mgbe ọ bụla na ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ ndị bara uru emetụtaghị anyị, wee leghara ya anya. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w 11/1/90 p. 31.]
35. Chineke nwere mmetụta, nhọrọ ndị anyị na-eme na-emetụtakwa ya. [kl p. 14 para. 8]