Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ ndị a ga-enyefe na November: Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi n’ụtụ ₦80. A ga-eme mgbalị pụrụ iche iji sochie ntinye akwụkwọ nile, na-ebu n’obi ịmalite ọmụmụ Bible ebe obibi. December: Bekee—New World Translation ya na akwụkwọ bụ́ Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nweta Ya? Yoruba—New World Translation of the Christian Greek Scriptures. Ọ bụrụ na ọ dịghị, nyefee Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ ma ọ bụ akwụkwọ ọ bụla dị 192 peji. Asụsụ ndị ọzọ—Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ ma ọ bụ Akwukwọm nke Akukọ Bible. Ọ bụrụ na ọ dịghị, nyefee akwụkwọ ọ bụla dị 192 peji. January na February: Bekee—Nlanarị Baa n’Ime Ụwa Ọhụrụ ma ọ bụ The Bible—God’s Word or Man’s? Efịk na Hausa—Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala, ma ọ bụ True Peace and Security—From What Source? Igbo—Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nweta Ya?, Ibu Nwa-okoro Na Ab̧ọghọ-Gi—Inweta Ihe Kachasi Nma Nime Ya, Irọrọ Uzọ Ndu nke Kachasi Nma, na Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala. Isoko—Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala. Yoruba—Happiness—How to Find It, Ibu Nwa-okoro Na Ab̧ọghọ-Gi—Inweta Ihe Kachasi Nma Nime Ya, Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala na Ndu Nka Ọ̀ Bu Nani Ndu Dinu? RỊBA AMA: Ọgbakọ ndị ga-achọ ihe ndị a ga-akpọsa e depụtara n’elu kwesịrị itinye ọda ha na Literature Order Form (S-14) ha nke ọnwa ọzọ.
◼ Ọgbakọ ndị ka nwere Akụkọ Alaeze nke 34 pụrụ ịgba ndị nkwusa ume inyefe ha n’otu ụzọ ahụ e si eji traktị ndị ọzọ eme ihe, ma ọ̀ bụ site n’ọnụ ụzọ ruo n’ọnụ ụzọ ma ọ bụ n’ebe ọzọ. Ọ bụrụ na a na-eme ya, ndị nkwusa pụrụ ịhapụ otu n’ebe ọ bụla a na-enwetaghị mmadụ n’ụlọ, na-ejide n’aka na e debere ya n’ebe ndị na-agafe agafe na-agaghị ahụ ya ma ọlị. E kwesịrị ime mgbalị ikesa ndị nile fọdụrụnụ n’ozi a bara uru.
◼ Ndị nkwusa ụfọdụ ajụwo banyere otú e kwesịrị isi dee aha nwanna nwanyị lụrụ di na kaadị Pioneer Service Identification ya. O kwesịrị ibu “Mrs.” mgbe ahụ aha di ya n’ozuzu ya. N’isochi nke a, e kwesịrị ide aha aka nwanna nwanyị ahụ n’ime akara ngebichi, dị ka ihe atụ, Mrs. John A. Witness (Sarah D.).
◼ Mgbe nwanna nwanyị bụ́ onye ọsụ ụzọ na-alụbeghị di lụrụ di, odeakwụkwọ ọgbakọ kwesịrị inye Society aha di ya n’ozuzu ya na akara ụbọchị alụmdi na nwunye ahụ. Mgbe nke ahụ gasịrị, a ga-edepụta aha nwanna nwanyị ahụ dị ka e gosiri n’elu.
◼ Mgbe onye ọ bụla chọpụtara na ọ dị mkpa ya ịkwụsị ịsụ ụzọ n’ihi ihe ụfọdụ, o kwesịrị ịgwa ndị okenye nọ n’ọgbakọ. Mgbe ahụ ha kwesịrị ịgwa Society, na-eji fọm S-206 eme ihe. E kwesịrị inye nkọwa dị mkpirikpi banyere ihe mere onye ahụ jiworo kwụsị ịsụ ụzọ, kọmitii ije ozi nke ọgbakọ ya kwesịkwara ịbịanye aka na fọm ahụ.