“Onyenwe Anyị Bụ Onye Na-enyere M Aka”
1 Mgbe Jisọs nyere ndị na-eso ụzọ ya mbụ ọrụ, ọ gwara ha, sị: “Lee, Mụ onwe m na-ezipụ unu dị ka atụrụ n’etiti agụ.” (Mat. 10:16) Nke ahụ ò mere ka ha tụọ ụjọ ma laa azụ? Ee e. Ha zụlitere echiche ahụ nke Pọl onyeozi mesịrị kwupụta mgbe ọ gwara ndị Kraịst ibe ya, sị: “Were obi ike sị, Onyenwe anyị bụ onye na-enyere m aka; m gaghị atụ egwu: gịnị ka mmadụ ga-eme m?” (Hib. 13:6) Ha ṅụrịrị ọṅụ ịbụ ndị a gụrụ ná ndị kwesịrị ka e mee ha ihe ihere n’ihi aha Jisọs, ha adịghịkwa ahapụ izi ihe na izisa ozi ọma ahụ.—Ọrụ 5:41, 42.
2 Taa ọrụ ime nkwusa zuru ụwa ọnụ nọ n’ágbà ikpeazụ ya. Dị nnọọ ka Jisọs buru n’amụma, mba nile akpọwo anyị asị. (Mat. 24:9) E megidewo ma kwaa ọrụ ime nkwusa anyị emo, n’akụkụ ụwa ụfọdụkwa, ọbụna na a machibidowo ya iwu. Ọ bụrụ na anyị enweghị okwukwe, a pụrụ imenye anyị ụjọ. Otú ọ dị, ịmata na Jehova bụ Onye Na-enyere anyị aka na-enye anyị ume ọhụrụ ma na-ewusi anyị ike ịnọgidesi ike.
3 Obi ike bụ àgwà nke ịdị ike, inwe anyaike, na ịbụ dike. Ọ na-emegide egwu, enweghị obi ike, na ụjọ. Obi ike adịwo ndị na-eso ụzọ Jisọs mkpa mgbe nile iji tachie obi. Ọ dị mkpa ma ọ bụrụ na anyị ga-ezere ịbụ ndị àgwà na omume nke ụwa na-ebuso Chineke iro kụdara mmụọ. Lee ka o si bụrụ ihe na-agba ume nye anyị iche echiche banyere ihe nlereanya magburu onwe ya nke Jisọs, bụ́ onye meriri ụwa! (Jọn 16:33) Chetakwa, ndị ozi bụ́ ndị ji anyaike kwupụta n’agbanyeghị ule dị iche iche siri ike, sị: “Anyị aghaghị ikwenyere Chineke karịa mmadụ.”—Ọrụ 5:29.
4 Anyị Adịghị n’Etiti Ndị Wezụgara Onwe Ha: Anyị kwesịrị ịgbalịsi ike ịnọgide na-enwe àgwà dị mma banyere ọrụ anyị. (Hib. 10:39) Buru n’uche mgbe nile na ọ bụ Jehova na-ezipụ anyị dị ka ngosipụta nke ịhụnanya na ebere ya n’ebe ihe nile a kpọrọ mmadụ nọ. Ọ dịghị mgbe ọ na-agwa ndị ohu ya ka ha mee ihe ọ bụla na-enweghị uru ọ bara. Ihe ọ bụla e kenyere anyị ime ga-emesịa bụrụ maka ọdịmma nke ndị hụrụ Chineke n’anya.—Rom 8:28.
5 Inwe nchekwube ga-enyere anyị aka ịnọgide na-achọ ndị yiri atụrụ nọ n’ókèala anyị. Anyị pụrụ ile enweghị mmasị nke ndị mmadụ na-egosi anya dị ka ngosipụta nke obi nkoropụ na enweghị olileanya ha. Ka ịhụnanya anyị kwalie anyị inwe ọmịiko na ndidi. Mgbe ọ bụla anyị tinyere akwụkwọ ma ọ bụkwanụ chọta ntakịrị mmasị, ihe mgbaru ọsọ anyị kwesịrị ịbụ ịga nletaghachi ozugbo ma kpalikwuo mmasị. Anyị ekwesịtụghị inwe obi abụọ banyere ikike anyị nwere ịmalite ọmụmụ Bible ma ọ bụ ịdị irè n’iduzi ya. Kama nke ahụ, anyị kwesịrị ịdị na-achọ enyemaka na nduzi Jehova mgbe nile, sitekwa n’ekpere, na-enwe obi ike na ọ ga-enyere anyị aka.
6 Anyị kwenyesiri ike na Jehova ga-ahụ na a rụzuru ọrụ ahụ. (Tụlee Ndị Filipaị 1:6.) Ntụkwasị obi anyị nile n’ebe ọ nọ dị ka Onye Na-enyere anyị aka na-ewusi anyị ike, ka ‘ike wee ghara ịgwụ anyị n’ime ihe ọma.’—Gal. 6:9.