Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enyefe na May: Asụsụ nile—Ụtụ Ụlọ Nche. Magazin ndị a na-ebipụta ugboro abụọ n’ọnwa maka otu afọ, ₦280. Otu afọ maka ndị a na-ebipụta otu ugboro n’ọnwa ma ọ bụ ọnwa isii maka ndị a na-ebipụta ugboro abụọ n’ọnwa, ₦140. Maka ozi etiti izu na n’ókèala a na-arụzu mgbe mgbe, a pụrụ iji broshuọ ọhụrụ ahụ, bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị?, mee ihe. June: Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. Tinye uche n’ịmalite ọmụmụ Bible ebe obibi. July na August: Nke ọ bụla n’ime broshuọ na-esonụ nwere peji 32: Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?, Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?, Idi Ndụ n’Elu Ala Rue Mgbe Ebighị-ebi!, Ì Kwesịrị Ikwere n’Atọ n’Ime Otu?, Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ, na Ọchịchị Ahụ Nke Ga-eweta Paradaịs. RỊBA AMA: Ọgbakọ ndị ga-achọ ihe ndị a ga-akpọsa e depụtara n’elu kwesịrị itinye ọda ha na Literature Order Form (S-14) ha nke ọnwa ọzọ.
◼ Mgbe ọgbakọ ma ọ bụ ndị mmadụ na-edetara Society akwụkwọ ozi, e kwesịrị idenye nọmba sekit nke ọgbakọ ahụ n’adres nzighachi ozi, ma n’envelopu ma n’adres nke dị n’ime.
◼ A ga-enwe ntụgharị nke asụsụ maka ndị ogbi na ndị ntị chiri ná mgbakọ sekit ndị na-esonụ: EE-4 (Igwuruta Ali), June 7-8, 1997; EE-8 (Akabo), October 4-5, 1997; EE-9 (Uli), September 13-14, 1997; na WE-13 (Ota), August 16-17, 1997.
◼ Onye isi oche ndị nlekọta ga-ahụ na e denyere mgbanwe ndị na-esonụ na Cost List nke March 1, 1997, nke ọgbakọ: Ọ́bọ́ Kaadị Uwe/ọ́bọ́ kaadị ókèala, ₦10 maka otu; Ọkpụkpọ Òkù Maka Nzukọ, ₦90 maka 500 ọ bụla.
◼ Akwụkwọ Ndị E Nwere Ugbu A:
Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ—Bekee, Efịk, Gun, Hausa, Igbo, Isoko, Tiv, Yoruba
Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị?—Bekee, Efịk, Hausa, Igala, Igbo, Isoko, Tiv, Yoruba
Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi—Gun
Ndịàmà Jehova na Agụmakwụkwọ—Efịk, Igbo, Yoruba
Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?—Tiv
Ịnọ ná Ntụkwasị Obi Zuru Ụwa Ọnụ n’Okpuru “Onyeisi Udo” Ahụ—Igbo
◼ Akwụkwọ Ọhụrụ Ndị E Nwere:
Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?—Igala
Ụzọ Isi Malite ma Na-aga n’Ihu ná Nkwurịta Okwu Bible—Efịk, Hausa, Igbo, Isoko, Tiv, Yoruba
Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?—Igala
Akwukwọm nke Akukọ Bible—Tiv
Ndụ n’Ime Ụwa Ọhụrụ nke Udo (Traktị Nọ. 15)—Asụsụ Maka Ndị Ogbi na Ndị Ntị Chiri
◼ Compact Disc Ndị Ọhụrụ E Nwere:
Kingdom Melodies, Mpịakọta nke 1 (cdm-1)
◼ Kaseti A Na-egere Egere Ndị Ọhụrụ E Nwere:
Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị?—Bekee
Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi—Bekee
◼ Kaseti Vidio Ndị Ọhụrụ E Nwere:
Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị?—Asụsụ Maka Ndị Ogbi na Ndị Ntị Chiri
Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi (Mpịakọta nke 2 ruo nke 6)—Asụsụ Maka Ndị Ogbi na Ndị Ntị Chiri