Igbe Ajụjụ
◼ Nlezianya ndị dị aṅaa dị mkpa mgbe anyị na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe anyị na-emekọ ihe n’ihe metụtara ozi anyị?
Anyị nwere ihe mere anyị ga-eji tụọ anya na ụmụnna anyị ndị nwoke na nwanyị bu n’obi ịrapara n’ụkpụrụ omume kasị elu n’àgwà ha. Ka o sina dị, anyị bi n’ụwa nke na-adịghị ọcha na ime ihe masịrị onye nke na-enwekebeghị ịkpa ókè omume. Ọ bụ ezie na anyị pụrụ ibu ihe kasị mma n’obi, anyị aghaghị ịnọ na nche mgbe nile iji zere iweta nkọcha ma ọ bụ itinye aka n’ihe na-ekwesịghị ekwesị. Nke a na-agụnye ilezi anya mgbe a na-ekere òkè n’ozi.
N’ozi ubi, anyị na-ezutekarị ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe anyị bụ́ ndị na-egosi ihe yiri ezi mmasị n’eziokwu ahụ. Ọ bụrụ na ọ bụ nanị anyị so mgbe anyị gara, e nweghịkwa onye ọzọ nọ n’ụlọ, ọ ga-akasị mma ịgba àmà n’ọnụ ụzọ kama ịbanye n’ime. Ọ bụrụ na e gosiri mmasị, a pụrụ ime ndokwa ịlaghachi mgbe onye nkwusa ọzọ ga-eso anyị ma ọ bụ mgbe ndị ọzọ so n’ezinụlọ ahụ ga-anọkwa ya. Ọ bụrụ na nke a ekweghị omume, ọ ga-abụ ihe amamihe dị na ya inyefe onye nwe ụlọ ahụ n’aka onye nkwusa nke bụ nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ya. Nke a metụtakwara iduziri onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe anyị ọmụmụ Bible.—Mat. 10:16.
Ọ dị anyị mkpa ilezi anya mgbe a na-ahọrọ onye a ga-eso rụkọọ ọrụ n’ozi. Ọ bụ ezie na ndị nkwusa pụrụ iso ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ha rụkọọ ọrụ mgbe ụfọdụ, ọ na-akasị mma ime nke a mgbe a nọ n’ìgwè. Dị ka ọ na-adịkarị, ọbụna mgbe a nọ n’ozi, ọ bụ ihe amamihe na-adịghị na ya anyị isoro onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe anyị nke na-abụghị di ma ọ bụ nwunye anyị na-anọkọ nanị anyị. N’ihi ya, nwanna nwoke nke na-eduzi ìgwè ozi ahụ kwesịrị iji ezi uche mee ihe mgbe ọ na-ekenye ndị nkwusa, gụnyere ndị nọ n’afọ iri na ụma, ịrụkọ ọrụ.
Site n’iji ezi uche eme ihe mgbe nile, anyị ga-ezere ‘ime ihe ịsụ ngọngọ ọ bụla’ nye onwe anyị ma ọ bụ ndị ọzọ.—2 Kọr. 6:3.