Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enyefe na July na August: Nke ọ bụla n’ime broshuọ na-esonụ nwere peji 32: Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?, Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?, Idi Ndụ n’Elu Ala Rue Mgbe Ebighị-ebi!, Ì Kwesịrị Ikwere n’Atọ n’Ime Otu?, Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ, na Ọchịchị Ahụ Nke Ga-eweta Paradaịs. September: Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ. October: Ụtụ maka Teta! ma ọ bụ Ụlọ Nche ma ọ bụ maka magazin abụọ ahụ. Na-amalite n’akụkụ ikpeazụ nke ọnwa ahụ, a ga-ekesa Akụkọ Alaeze nke 35. RỊBA AMA: Ọgbakọ ndị ga-achọ ihe ndị a ga-akpọsa e depụtara n’elu, e wezụga Akụkọ Alaeze nke 35 nke a ga-ezigara ọgbakọ nile, kwesịrị itinye ọda ha na Literature Order Form (S-14) ha nke ọnwa ọzọ.
◼ N’inwe ngwụsị izu ise zuru ezu, ọnwa August pụrụ ịbụ oge dị mma nye ọtụtụ ndị ịrụ ọsụ ụzọ inyeaka.
◼ Na-amalite na September, ndị nlekọta sekit ga-ekwu okwu ihu ọha isiokwu ya bụ “Tụkwasị Obi n’Ike Nzọpụta nke Jehova.”