Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ ndị a ga-enyefe ná December: Bekee—New World Translation ya na akwụkwọ bụ́ The Bible—God’s Word or Man’s? Akwụkwọ ọzọ a pụrụ inyefe: Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ ma ọ bụ Akwukwọm nke Akukọ Bible. Yoruba—New World Translation of the Christian Greek Scriptures ya na akwụkwọ bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. Akwụkwọ ọzọ a pụrụ inyefe: Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ ma ọ bụ akwụkwọ ọ bụla dị peji 192. Asụsụ ndị ọzọ—Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. Akwụkwọ ọzọ a pụrụ inyefe: Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ, Akwukwọm nke Akukọ Bible, ma ọ bụ akwụkwọ ọ bụla dị peji 192. January: A pụrụ inyefe akwụkwọ ọ bụla dị peji 192 e biri n’akwụkwọ na-achanwụ achanwụ ma ọ bụ ndị na-agbanwe ụcha ha ma ọ bụ nke ọ bụla e bipụtara tupu 1985 n’ọnụ ego dị ala. Ọ bụrụ na ọgbakọ ọ bụla nwere akwụkwọ Ime Ka Ndu Ezi-na-ulo Gi Nwe Obi-utọ, ha nwekwara ike nyefee akwụkwọ a n’ọnụ ego dị ala. A gaghị agụnye akwụkwọ ndị ọzọ dị peji 192 e bipụtara tupu 1985 bụ́ ndị e biri n’akwụkwọ na-adịghị achanwụ achanwụ ma ọ bụ ndị na-adịghị agbanwe ụcha ha ná ndị a ga-enyefe n’ọnụ ego a e mere ka ọ dị ala. Akwụkwọ ndị ọzọ a pụrụ inyefe: Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nweta Ya?, Ịdị n’Otu n’Ofufe nke Nanị Ezi Chineke Ahụ, Ịnọ ná Ntụkwasị Obi Zuru Ụwa Ọnụ n’Okpuru “Onyeisi Udo” Ahụ, ma ọ bụ Nlanarị Baa n’Ime Ụwa Ọhụrụ. February: Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso! Akwụkwọ ọzọ a pụrụ inyefe: Akwụkwọ ọ bụla dị peji 192 ka mee ochie e nwere. March: Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. Lekwasị anya n’ịmalite ọmụmụ Bible ebe obibi. RỊBA AMA: Ọgbakọ ndị ga-achọ ihe ndị a ga-akpọsa e depụtara n’elu kwesịrị itinye ọda ha na Literature Order Form (S-14) ha nke ọnwa ọzọ.
◼ Ọgbakọ ndị ka nwere Akụkọ Alaeze nke 35 pụrụ ịgba ndị nkwusa ume inyefe ha n’otu aka ahụ e ji enyefe traktị, ma ọ bụ site n’ụlọ ruo n’ụlọ ma ọ bụ ebe ọ bụla ọzọ. Ọ bụrụ na o kwesịrị ekwesị, ndị nkwusa pụrụ ịhapụ otu n’ụlọ onye na-anọghị ya, na-ejide n’aka na ndị na-agafe agafe agaghị ahụ ya. E kwesịrị itinye mgbalị ikesa ndị nile fọdụrụ n’ime ozi a dị mkpa.
◼ Ndị okenye kwesịrị ịmalite ugbu a mewe atụmatụ tupu oge eruo maka nkesa magazin pụrụ iche nke zuru mba ọnụ na December 25 na 26. E kwesịrị ịgba mmadụ nile ume ikere òkè n’ihe omume a pụrụ iche.
◼ Onye isi oche ndị nlekọta ma ọ bụ onye ọ họpụtara kwesịrị ịgụzigharị ihe ndekọ ego ọgbakọ na December 1 ma ọ bụ ngwa ngwa o kwere omume mgbe nke ahụ gasịrị. Maara ọgbakọ ọkwa mgbe e mesịworo nke a.
◼ Ememe Ncheta nke 1999 ga-abụ na Thursday, April 1, mgbe anyanwụ dasịrị. A na-ama ọkwa nke a n’oge ka ụmụnna wee nwee ike ime nchekwa ndị dị mkpa ma ọ bụ nweta ụlọ nzukọ ndị e nwere mgbe ọtụtụ ọgbakọ na-eji otu Ụlọ Nzukọ Alaeze eme ihe, nke na ha aghaghịkwa ịchọta ebe ndị ọzọ. Ndị okenye na ndị na-elekọta ebe ndị a kwesịrị inwe nkwekọrịta ka e wee jide n’aka na a gaghị enwe mkpọtụ site n’ihe omume ndị ọzọ a na-eme n’ụlọ ahụ ka e wee mee Ememe Ncheta ahụ n’udo na n’usoro. N’ihi ịdị mkpa nke ememe ahụ, n’ikenye onye ga-ekwu okwu Ememe Ncheta, òtù ndị okenye kwesịrị ịhọrọ otu n’ime ndị okenye ka ruo eru kama nanị ịdị na-eme onye mee ibe ya emee ma ọ bụ ịdị na-eji otu nwanna eme ihe kwa afọ.