Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 5/98 p. 7
  • Ịkụziri Ndị Toworo Eto Ịgụ Ihe

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịkụziri Ndị Toworo Eto Ịgụ Ihe
  • Ozi Alaeze Anyi—1998
Ozi Alaeze Anyi—1998
km 5/98 p. 7

Ịkụziri Ndị Toworo Eto Ịgụ Ihe

Ikike ịgụ ihe na-eweta ọṅụ ime obi na nghọta ka ukwuu. Ihe kasị na-akwụ ụgwọ bụ ịgụ na itinye Okwu Chineke n’ọrụ bụ́ nke na-eweta ndụ ebighị ebi. (Mkpu. 1:3) Ọtụtụ malitere ijere Jehova ozi n’agadi ha. Ihe ka ọtụtụ ná ndị a na-enwe afọ ojuju nke ime obi mgbe ha nwere ike ‘inyocha ihe nile e deworo n’akwụkwọ nsọ kwa ụbọchị, ma ihe ndị a dị otú a.’ (Ọrụ 17:11) Ya mere anyị nile kwesịrị inwe mmasị inyere ndị ọzọ aka bụ́ ndị ọ pụrụ ịbụ na ha enwechaghị ezi ihe ùgwù nke ịgụ ihe n’onwe ha. Ihe ọmụma ndị na-esonụ ga-enyere ndị nwere ihe ùgwù nke iduzi klas ịma ịgụ na ide aka.

◼ Achọkarịla nnukwu ihe n’aka ha, akụzikwarala onye mmụta ahụ ihe karịrị akarị n’otu oge ọmụmụ ihe. Nke a pụrụ ime ka onye mmụta ahụ nwee nkụda obi, wee kwụsị ịbịa ọmụmụ ihe.

◼ Na-enye agbamume mgbe nile, na-nwekwa nchekwube. A na-eji nke nta nke nta, n’usoro n’usoro amụta nkà ịgụ ihe. Ndị mmụta kwesịrị inweta afọ ojuju n’ọganihu ha. Gbaa ndị mmụta ume itinye ihe ha na-amụta n’ọrụ ngwa ngwa dị ka o kwere mee. Ndị nkụzi pụrụ inyere ha aka ịgụpụta azịza ma ọ bụ akụkụ akwụkwọ nsọ ná nzukọ ndị Kraịst ma ọ bụ ịgụpụta otu akụkụ akwụkwọ nsọ n’ozi ubi. Nke a ga-egosi n’ụzọ dị ike uru a na-ahụ anya nke klas ịma ịgụ na ide bara.

◼ Egbula oge n’ihe na-emetụtaghị ihe a na-amụ. Ndị toworo eto bụ ndị na-eji ọrụ n’aka. Jiri oge ọmụmụ ihe klas mee ihe kasịnụ iji kụzie ihe ndị ka mkpa.

◼ Na-akwanyere ndị mmụta ahụ ùgwù mgbe nile, na-enye ha nsọpụrụ kwesịrị ha. Emechula ha ihu ma ọ bụ ledaa ha anya. Mụrụ anya maka nsogbu ha na-enwe n’otu n’otu. Ọ pụrụ ịbụ na ụfọdụ ndị mmụta enweghị ike ịgụ ihe e dere kịrị kịrị n’ihi na enyo anya dị ha mkpa. Ndị ọzọ pụrụ ịdị na-anụ ntị ike. Ọmịiko na akọ dị mkpa n’iso mmadụ nile na-emekọ ihe.

◼ Iji nwee ọganihu, ndị mmụta kwesịrị ime ihe omume a na-eme n’ụlọ ọtụtụ hour maka nkụzi otu hour ọ bụla a kụziri. Onye nkụzi pụrụ ịgwa ndị ọzọ ka ha nyere ndị mmụta aka ime ihe omume a na-eme n’ụlọ ha.

N’ikpeazụ, nwee ndidi, na-agba ume, na-ajakwa mma mgbe nile. Site n’itinye ụkpụrụ ndị dị n’elu n’ọrụ, ị ga-atụnye ụtụ n’ọṅụ nke ndị toworo eto bụ́ ndị enyemaka dị mkpa iji wee nwee ike ịgụ ihe.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya